< Abụ Ọma 22 >
1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ nke “Nne ele nke ụtụtụ.” Abụ Ọma Devid. Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m? Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m, nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile?
Kwa mtsogoleri wa mayimbidwe. Monga mwa “Mbawala yayikazi ya Mmawa.” Salimo la Davide. Mulungu wanga, Mulungu wanga, nʼchifukwa chiyani mwandisiya? Chifuwa chiyani simukundithandiza ndi pangʼono pomwe? Nʼchifukwa chiyani simukumva mawu a kudandaula kwanga?
2 O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m, nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere.
Inu Mulungu wanga, ine ndimalira masana, koma simuyankha, usikunso, ndipo sindikhala chete.
3 Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ; ị bụ otuto ndị Izrel.
Inu ndinu Woyera, wokhala pa mpando waufumu; ndinu matamando a Israeli.
4 Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi; ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha.
Pa inu makolo athu anadalira; iwo anadalira ndipo Inu munawapulumutsa.
5 Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara; ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi.
Analirira kwa inu ndipo munawapulumutsa. Iwo anakhulupirira Inu ndipo simunawakhumudwitse.
6 Abụ m idide, abụghị m mmadụ; onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya.
Koma ine ndine nyongolotsi osati munthu, wosekedwa ndi wonyozedwa ndi anthu onse.
7 Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị; na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị.
Onse amene amandiona amandiseka; amandiyankhulira mawu achipongwe akupukusa mitu yawo kunena kuti
8 “O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi; ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya. Ya napụta ya ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya.”
“Iyeyu amadalira Yehova, musiyeni Yehovayo amulanditse. Musiyeni Yehova amupulumutse popeza amakondwera mwa Yehovayo.”
9 Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara.
Komabe Inu ndinu amene munandibadwitsa, munanditulutsa mʼmimba mwa amayi anga. Munachititsa kuti ndizikudalirani ngakhale pa nthawi imene ndinkayamwa.
10 Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị. Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m.
Chibadwire ine ndinaperekedwa kwa Inu; kuchokera mʼmimba mwa amayi anga Inu mwakhala muli Mulungu wanga.
11 Anọla m ebe dị anya, nʼihi na nsogbu dị nso. Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.
Musakhale kutali ndi ine, pakuti mavuto ali pafupi ndipo palibe wina wondipulumutsa.
12 Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu; oke ehi dị ike nke Bashan gbara m gburugburu.
Ngʼombe zazimuna zandizungulira; ngʼombe zazimuna zamphamvu za ku Basani zandizinga.
13 Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa asaghepụla ọnụ ha megide m.
Mikango yobangula pokadzula nyama, yatsekula kwambiri pakamwa pawo kulimbana nane.
14 A wụpụla m dịka mmiri, ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha. Obi m agbazela dịka mmanụ, obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m.
Ine ndatayika pansi ngati madzi ndipo mafupa anga onse achoka mʼmalo mwake. Mtima wanga wasanduka phula; wasungunuka mʼkati mwanga.
15 Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime. Ire m na-araparakwa m nʼọnụ, nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ.
Mphamvu zanga zauma ngati phale, ndipo lilime langa lamamatira ku nsagwada; mwandigoneka mʼfumbi la imfa.
16 Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu; otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu, ha adupuola m aka m na ụkwụ m.
Agalu andizungulira; gulu la anthu oyipa landizinga. Alasa manja ndi mapazi anga.
17 A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ; ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị
Ine nditha kuwerenga mafupa anga onse; anthu amandiyangʼanitsitsa ndi kundidzuma.
18 Ha na-eke uwe m nʼetiti ha, ha sitere nʼife nza kee uwe m.
Iwo agawana zovala zanga pakati pawo ndi kuchita maere pa zovala zangazo.
19 Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya; gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka.
Koma Inu Yehova, musakhale kutali; Inu mphamvu yanga, bwerani msanga kuti mudzandithandize.
20 Napụta ndụ m site na mma agha, site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa.
Pulumutsani moyo wanga ku lupanga, moyo wanga wopambanawu ku mphamvu ya agalu.
21 Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a, zọpụta m site na mpi atụ ndị a.
Ndilanditseni mʼkamwa mwa mikango; pulumutseni ku nyanga za njati.
22 Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m; nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto.
Ine ndidzalengeza dzina lanu kwa abale anga; ndidzakutamandani mu msonkhano.
23 Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya; unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya! Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!
Inu amene mumaopa Yehova mutamandeni! Inu zidzukulu zonse za Yakobo, mulemekezeni! Muopeni mwaulemu, inu zidzukulu zonse za Israeli!
24 Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya maọbụ kwaa ya emo; o lefughị ya anya kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya.
Pakuti Iye sanapeputse kapena kunyoza kuvutika kwa wosautsidwayo; Iye sanabise nkhope yake kwa iye. Koma anamvera kulira kwake kofuna thandizo.
25 Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị; aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị.
Ndidzakutamandani pa msonkhano waukulu chifukwa cha zimene mwandichitira. Ndidzakwaniritsa lonjezo langa pamaso pa amene amaopa Inu.
26 Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha, ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
Osauka adzadya ndipo adzakhuta; iwo amene amafunafuna Yehova adzamutamanda. Mitima yanu ikhale ndi moyo mpaka muyaya!
27 Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta, ma laghachikwute Onyenwe anyị. Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche ga-akpọ isiala nʼihu ya.
Malekezero onse a dziko lapansi adzakumbukira Yehova ndi kutembenukira kwa Iye, ndipo mabanja a mitundu ya anthu adzawerama pamaso pake,
28 Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị, ọ na-achịkwa mba niile.
pakuti ulamuliro ndi wake wa Yehova ndipo Iye amalamulira anthu a mitundu yonse.
29 Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya; ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya; ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ.
Anthu olemera onse a dziko lapansi adzachita phwando ndi kulambira; onse amene amapita ku fumbi adzagwada pamaso pake; iwo amene sangathe kudzisunga okha ndi moyo.
30 Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi; a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị.
Zidzukulu zamʼtsogolo zidzamutumikira Iye; mibado ya mʼtsogolo idzawuzidwa za Ambuye.
31 Ha ga-ekwusa ezi omume ya nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị nʼihi na o meela ya.
Iwo adzalengeza za chilungamo chake kwa anthu amene pano sanabadwe pakuti Iye wachita zimenezi.