< Abụ Ọma 21 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, lee na eze na-aṅụrị ọṅụ nʼike gị. Obi na-atọkwa ya ụtọ nke ukwuu nʼihi mmeri niile i nyere ya!
Kwa kiongozi wa muziki. Zaburi ya Daudi. Mfalme anashangilia katika uweza wako, Yahwe! Ni kwa namna kuu anashangilia katika wokovu uliouleta!
2 I nyela ya ihe obi ya chọrọ; i mekwaara ya ihe niile ọ rịọrọ gị! (Sela)
Wewe umempa yeye matamanio ya moyo wake na hauja mkatalia maombi midomo yake.
3 I ji ngọzị bara ụba nabata ya, ọ bụkwa okpueze e ji ọlaedo a ṅụchara nke ọma kpụọ ka i kpukwasịrị ya nʼisi.
Kwa kuwa wewe unamletea baraka nyingi; wewe uliweka katika kichwa chake taji ya dhahabu iliyo safi kabisa.
4 Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya mekwaa ka o nwee ogologo ndụ nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Yeye alikuomba wewe maisha; ukampatia maisha; wewe ulimpatia maisha malefu milele na milele.
5 Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya, ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya.
Yeye utukufu wake ni mkuu kwa sababu ya ushindi wako; wewe umemuwekea mapambo na enzi.
6 Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, i mere ka o nwee obi ụtọ nke na-esite nʼọṅụ nke nọnyere gị.
Kwa kuwa unampatia yeye baraka za kudumu; unamfurahisha kwa furaha ya uwepo wako.
7 Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya nke Onye kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ.
Kwa kuwa Mfalme humwamini Yahwe; kwa kupitia uaminifu wa agano la aliye juu zaidi yeye hataondolewa.
8 Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile; aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị.
Mkono wako utawakamata adui zangu wote wote; mkono wako wa kuume utawakamata wale wote wanao kuchukia.
9 Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ, ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu. Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha, ọkụ ya ga-erepịakwa ha.
Wakati wa hasira yako, wewe utawachoma kama katika tanuru la moto. Yahwe atawamaliza wao katika hasira yake, na moto utawateketeza upesi wao.
10 Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi, ụmụ ha kwa site, nʼetiti ụmụ mmadụ.
Wewe utawaangamiza watoto wao duniani na ukoo wao kutoka katika mrorongo wa wanadamu.
11 Nʼagbanyeghị na ha nwere ike ịpịa ọpịpịa ọjọọ megide gị, maọbụ tụpụta atụmatụ ọjọọ, ha agaghị emezu ebumnuche ha.
Kwa kuwa walikusudia kukufanyia mambo maovu wewe; wao walitunga njama ambayo kwayo hawawezi kufanikiwa!
12 Nʼihi na i ga-eme ka ha gbaghachi azụ mgbe i kwere ụta gị tụgide ha nʼihu.
Kwa kuwa wewe utawarudisha nyuma; wewe utafyatua upinde wako mbele yao.
13 O Onyenwe anyị, ka e bulie gị elu nʼihi ike gị; anyị ga-abụ abụ ma tokwaa ike gị.
Uninuliwe, Yahwe, katika uweza wako; tutaimba na kusifu nguvu zako.

< Abụ Ọma 21 >