< Abụ Ọma 21 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, lee na eze na-aṅụrị ọṅụ nʼike gị. Obi na-atọkwa ya ụtọ nke ukwuu nʼihi mmeri niile i nyere ya!
For the leader. A psalm of David. The king rejoices, Lord, in your might, how he exults because of your help!
2 I nyela ya ihe obi ya chọrọ; i mekwaara ya ihe niile ọ rịọrọ gị! (Sela)
You have granted to him his heart’s desire, you have not withheld his lips’ request. (Selah)
3 I ji ngọzị bara ụba nabata ya, ọ bụkwa okpueze e ji ọlaedo a ṅụchara nke ọma kpụọ ka i kpukwasịrị ya nʼisi.
You came to meet him with rich blessings, you set on his head a golden crown.
4 Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya mekwaa ka o nwee ogologo ndụ nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
He asked you for life, you gave it – many long days, forever and ever.
5 Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya, ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya.
Great is his glory because of your help, honor and majesty you lay upon him.
6 Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, i mere ka o nwee obi ụtọ nke na-esite nʼọṅụ nke nọnyere gị.
For you make him most blessed forever, you make him glad with the joy of your presence.
7 Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya nke Onye kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ.
For the king puts always his trust in the Lord; the Most High, in his love, will preserve him unshaken.
8 Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile; aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị.
Your hand will reach all your foes, your right hand, all who hate you.
9 Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ, ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu. Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha, ọkụ ya ga-erepịakwa ha.
You will make them like a furnace of fire, when you appear, Lord. The Lord will swallow them up in his wrath. The fire will devour them.
10 Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi, ụmụ ha kwa site, nʼetiti ụmụ mmadụ.
You will sweep their offspring from the earth, their children from humanity.
11 Nʼagbanyeghị na ha nwere ike ịpịa ọpịpịa ọjọọ megide gị, maọbụ tụpụta atụmatụ ọjọọ, ha agaghị emezu ebumnuche ha.
When they scheme against you and hatch evil plots – they will fail.
12 Nʼihi na i ga-eme ka ha gbaghachi azụ mgbe i kwere ụta gị tụgide ha nʼihu.
For you aim your bow at their faces, make them turn in flight.
13 O Onyenwe anyị, ka e bulie gị elu nʼihi ike gị; anyị ga-abụ abụ ma tokwaa ike gị.
Be exalted, Lord, in your strength, to your might we shall sing and make music.

< Abụ Ọma 21 >