< Abụ Ọma 2 >

1 Gịnị mere mba niile ji agba izu nzuzo? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?
NO ke aha la e kupikipikio ai ko ka aina e? A e noonoo ai ka poe kanaka i ka mea lapuwale?
2 Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.
Ua ku e aku na'lii o ka honua, Ua ohumu pu aku no hoi na luna, Ia Iehova, a i kona Mea i poniia,
3 Ha na-asị, “Ka anyị tijie mkpọrọ igwe niile ha kere anyị ma tufukwaa ha, nwere onwe anyị.”
E moku aku kakou i ka laua mau mea paa, A e hoolei aku hoi mai o kakou aku nei i ka laua mau kaula.
4 Onye na-anọdụ nʼeluigwe na-achị ọchị. Onyenwe anyị na-akwa ha emo.
O ka Mea e noho ana ma ka lani, e aka mai no ia: A e hoomahua mai no hoi o ka Haku ia lakou.
5 Mgbe ahụ, ọ na-eji iwe baara ha mba mee ka ụjọ jupụta ha obi nʼihi oke iwe ya.
Alaila e olelo mai oia ia lakou i kona inaina, A e hoomakaua mai hoi ia lakou i kona huhu nui.
6 “Mụ onwe m eguzobela m eze m na Zayọn, ugwu m dị nsọ.”
Ua poni ae nei au i ka'u Alii maluna o Ziona, Maluna iho o ko'u mauna hoano.
7 Aga m ekwusa iwu Onyenwe anyị: Ọ sịrị m, “Ị bụ Ọkpara m; taa abụrụla m nna gị.
E hai aku au i ke kauoha: Ua olelo mai la o Iehova ia'u, O oe no ka'u Keiki; I keia la no, ua hoohanau aku wau ia oe.
8 Rịọọ m, aga m enye gị mba niile nke ụwa ka ha bụrụ ihe nketa gị.
E noi mai oe ia'u, a e haawi aku au ia oe I na lahuikanaka i hooilina nou, A i waiwai hoi nou na welelau o ka honua.
9 Ị ga-eji mkpara igwe chịa ha, tipịa ha dịka onye na-akpụ ite si etipịa ite ndị ọ kpụrụ na-adịghị mma.”
E uhai oe ia lakou me ke kookoo hao: E ulupa hoi oe ia lakou me he ipulepo la.
10 Nʼihi nke a, unu ndị eze, bụrụnụ ndị nwere uche; ka nke a bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-achị achị nʼụwa.
No ia hoi, e hoonaauao oukou, e na alii; E aoia'ku no hoi oukou, e na lunakanawai o ka honua.
11 Jirinụ ịtụ egwu fee Onyenwe anyị ofufe; jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
E malama ia Iehova me ka weliweli, E hauoli hoi oukou me ka haalulu.
12 Sutukwanụ Ọkpara ahụ ọnụ ka iwe ghara iwe ya, ka unu ghara ị bụ ndị a lara nʼiyi nʼụzọ unu. Nʼihi na iwe ya pụrụ ịmalite nʼotu ntabi anya. Ndị niile na-eme ya ebe mgbaba ha bụ ndị a gọziri agọzi.
E honi aku i ke Keiki, o huhu mai ia, O make hoi oukou ia aoao, ke hoa iki ia mai kona inaina. Pomaikai wale ka poe a pau i hilinai aku ia ia.

< Abụ Ọma 2 >