< Abụ Ọma 2 >

1 Gịnị mere mba niile ji agba izu nzuzo? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?
Why have nations assembled tumultuously? And peoples meditate vanity?
2 Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.
Kings of the earth station themselves, and princes have been united together, against YHWH, and against His Messiah:
3 Ha na-asị, “Ka anyị tijie mkpọrọ igwe niile ha kere anyị ma tufukwaa ha, nwere onwe anyị.”
“Let us draw off Their cords, And cast Their thick bands from us.”
4 Onye na-anọdụ nʼeluigwe na-achị ọchị. Onyenwe anyị na-akwa ha emo.
He who is sitting in the heavens laughs, The Lord mocks at them.
5 Mgbe ahụ, ọ na-eji iwe baara ha mba mee ka ụjọ jupụta ha obi nʼihi oke iwe ya.
Then He speaks to them in His anger, and in His wrath He troubles them:
6 “Mụ onwe m eguzobela m eze m na Zayọn, ugwu m dị nsọ.”
“And I have anointed My King, On Zion—My holy hill.”
7 Aga m ekwusa iwu Onyenwe anyị: Ọ sịrị m, “Ị bụ Ọkpara m; taa abụrụla m nna gị.
I declare concerning a statute: YHWH said to me, “You [are] My Son, today I have brought You forth.
8 Rịọọ m, aga m enye gị mba niile nke ụwa ka ha bụrụ ihe nketa gị.
Ask of Me and I give nations [as] Your inheritance, And the ends of the earth [for] Your possession.
9 Ị ga-eji mkpara igwe chịa ha, tipịa ha dịka onye na-akpụ ite si etipịa ite ndị ọ kpụrụ na-adịghị mma.”
You rule them with a scepter of iron, You crush them as a vessel of a potter.”
10 Nʼihi nke a, unu ndị eze, bụrụnụ ndị nwere uche; ka nke a bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-achị achị nʼụwa.
And now, O kings, act wisely, Be instructed, O judges of earth,
11 Jirinụ ịtụ egwu fee Onyenwe anyị ofufe; jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
Serve YHWH with fear, And rejoice with trembling.
12 Sutukwanụ Ọkpara ahụ ọnụ ka iwe ghara iwe ya, ka unu ghara ị bụ ndị a lara nʼiyi nʼụzọ unu. Nʼihi na iwe ya pụrụ ịmalite nʼotu ntabi anya. Ndị niile na-eme ya ebe mgbaba ha bụ ndị a gọziri agọzi.
Kiss the Chosen One [[or Son]], lest He is angry, And you perish [from] the way, When His anger burns but a little, O the blessedness of all trusting in Him!

< Abụ Ọma 2 >