< Abụ Ọma 18 >

1 Abụ ọma Devid. Abụ Devid ohu Onyenwe anyị. Ọ bụụrụ Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị: O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m.
Kumutungamiri wokuimba. Pisarema raDhavhidhi muranda waJehovha. Akaimbira Jehovha mashoko orwiyo urwu paakarwirwa naJehovha kubva mumaoko avavengi vake vose nomuruoko rwaSauro. Akati: Ndinokudai, imi Jehovha, simba rangu.
2 Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya.
Jehovha ndiye dombo rangu, nhare yangu, murwiri wangu; Mwari wangu ndiye dombo rangu, wandinovanda maari. Ndiye nhoo yangu norunyanga rworuponeso rwangu, shongwe yangu.
3 Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m.
Ndinodana kuna Jehovha, iye akafanira kurumbidzwa, uye ndinoponeswa kubva kuvavengi vangu.
4 Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ; ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.
Mabote orufu akandipinganidza; mvura zhinji inoparadza yakandifukidza.
5 Ụdọ nke ili kere m gburugburu, ọnya nke ọnwụ guzogidere m. (Sheol h7585)
Mabote eguva akandimonera; misungo yorufu yakanangana neni. (Sheol h7585)
6 Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị; etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka; akwa m rutekwara ya ntị, o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
Pakutambudzika kwangu ndakadana kuna Jehovha; ndakadana kuna Mwari wangu kuti ndibatsirwe. Akanzwa inzwi rangu ari mutemberi yake; kuchema kwangu kwakasvika pamberi pake munzeve dzake.
7 Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji, ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.
Nyika yakadedera ikadengenyeka, uye nheyo dzamakomo dzakazunguzika;
8 Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta, ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta; icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.
Utsi hwakakwira huchibva mumhino dzake; moto unoparadza wakabuda mumuromo make, mazimbe anopisa akabuda mauri achipfuta.
9 O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.
Akatsemura matenga akauya pasi; makore erima akanga ari pasi petsoka dzake.
10 Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, o feliri elu nʼelu nku nke ifufe.
Akatasva makerubhi akabhururuka; akabhururuka pamapapiro emhepo.
11 O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.
Akaita rima chifukidzo chake, denga rake rakamupoteredza, iwo makore matema emvura okudenga.
12 Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii ji mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe gabiga.
Nokupenya kwaibva pamberi pake, makore akabuda akafamba, nechimvuramabwe nokupenya kwemheni.
13 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ; olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
Jehovha akatinhira kudenga; inzwi roWokumusoro-soro rikanzwika.
14 Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa, o jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.
Akapfura miseve yake akaparadzira vavengi vake, kupenya kukuru kwemheni kukavavhundutsa.
15 E kpughere ala ala nke oke osimiri, gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, site nʼịba mba gị, O Onyenwe anyị, na nkuume si gị nʼimi pụta.
Mipata yegungwa yakaiswa pachena, uye nheyo dzenyika dzakaiswa pachena pakutuka kwenyu, imi Jehovha, nokufema kwemhino dzenyu.
16 O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.
Akadzika pasi achibva kumusoro akanditora; akandibudisa pamvura zhinji yakadzika.
17 Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.
Akandinunura kubva kuvavengi vangu vane simba, kubva kuvadzivisi vangu, vakanga vakasimba zvikuru kwandiri.
18 Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m, ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.
Vakandinanga pazuva renjodzi yangu, asi Jehovha akanga ari mutsigiri wangu.
19 Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.
Akandibudisa akandiisa panzvimbo yakafarikana; akandinunura nokuti akanga achindifarira.
20 Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị; ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.
Jehovha akandiitira zvakafanira kururama kwangu; nokuchena kwamaoko angu.
21 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị, ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.
Nokuti ndakachengeta nzira dzaJehovha; handina kuita zvakaipa nokubva pana Mwari wangu.
22 Iwu ya niile dị nʼihu m, esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.
Mirayiro yake yose iri pamberi pangu; handina kutsauka pazvirevo zvake.
23 Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.
Ndakanga ndisina chandingapomerwa pamberi pake, uye ndakazvichengeta kuti ndigare kure nechivi.
24 Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, dịka ịdị ọcha nke aka m abụọ si dị nʼanya ya.
Jehovha akandipa mubayiro zvakaringana nokururama kwangu, zvakaringana nokuchena kwamaoko angu pamberi pake.
25 Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.
Kuna vakatendeka munoratidza kutendeka kwenyu, kuna vasina chavangapomerwa munoratidza kusapomerwa kwenyu,
26 Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.
kuna vakachena munoratidza kuchena kwenyu, asi kuna vakatsauka munoratidza hasha dzenyu.
27 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala.
Munoponesa vanozvininipisa, asi muchideredza vane meso anozvikudza.
28 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu, Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
Imi, iyemi Jehovha, munoita kuti mwenje wangu urambe uchipfuta; Mwari wangu anoshandura rima rangu richiva chiedza.
29 Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ, sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.
Norubatsiro rwenyu ndichaenda kundorwa hondo; naMwari wangu ndinogona kukwira rusvingo.
30 Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.
Kana ari Mwari, nzira yake yakakwana; shoko raJehovha harina charingapomerwa. Ndiye nhoo yavose vanovanda maari.
31 Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị?
Nokuti ndianiko Mwari kunze kwaJehovha? Uye ndianiko Dombo kunze kwaMwari wedu?
32 Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.
NdiMwari anondishongedza nesimba uye anokwanisa nzira yangu.
33 Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele; Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.
Anoita kuti tsoka dzangu dzive setsoka dzenondo; anoita kuti ndigone kumira pakakwirira.
34 Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.
Anodzidzisa maoko angu kurwa; maoko angu anowembura uta hwendarira.
35 Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, aka nri gị na-akwagidekwa m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.
Munondipa nhoo yenyu yokukunda, uye ruoko rwenyu rworudyi runonditsigira; munokotama pasi kuti mundiite mukuru.
36 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ, ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.
Munondiitira nzira yakapamhama pasi pangu, kuitira kuti zvitsitsinho zvangu zvirege kutedzemuka.
37 Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha; alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.
Ndakatevera vavengi vangu ndikavabata; handina kudzokera shure kusvikira vaparadzwa.
38 Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite. Ha dara nʼokpuru ụkwụ m.
Ndakavapwanya kuti vakoniwe kusimuka; vakawira pasi petsoka dzangu.
39 Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha, i wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.
Makandishongedza nesimba rokurwa; makaita kuti vadzivisi vangu vapfugame patsoka dzangu.
40 I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ. Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị.
Makaita kuti vavengi vangu vatize, uye ndakaparadza vavengi vangu.
41 Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.
Vakachemera kubatsirwa, asi hakuna akavaponesa, kunyange kuna Jehovha, asi haana kuvapindura.
42 Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu; a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ.
Ndakavapura vakatsetseka seguruva ratakurwa nemhepo; ndakavadururira pasi sedope renzira dzomumusha.
43 Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ ị meela m onyeisi nke ọtụtụ mba; ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.
Makandirwira pakurwisa kwavanhu; makandiita musoro wendudzi; vanhu vandakanga ndisingazivi vava varanda vangu.
44 Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.
Pavanongondinzwa, vanonditeerera; vatorwa vanokotama pamberi pangu.
45 Obi na-ada ha mba; ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.
Vose vanoora mwoyo; vanouya vachibva panhare dzavo vachidedera.
46 Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m! Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m.
Jehovha mupenyu! Dombo rangu ngarirumbidzwe! Ngaakudzwe Mwari Muponesi wangu!
47 Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ, onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m,
Ndiye Mwari anonditsivira, anoisa ndudzi pasi pangu,
48 onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro, napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.
anondiponesa pavavengi vangu. Makandisimudzira pamusoro pavavengi vangu. Makandinunura kubva kuvanhu vechisimba.
49 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche, aga m abụku aha gị abụ otuto.
Naizvozvo ndichakurumbidzai pakati pendudzi, imi Jehovha; ndichaimbira zita renyu nziyo dzokurumbidza.
50 Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu; Ọ na-egosikwa onye ya onye e tere mmanụ ịhụnanya na-adịghị ada ada, nye Devid na ndị agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
Anopa mambo wake kukunda kukuru; anoratidza unyoro hwake husingaperi kumuzodziwa wake, kuna Dhavhidhi nokuvana vake nokusingaperi.

< Abụ Ọma 18 >