< Abụ Ọma 18 >

1 Abụ ọma Devid. Abụ Devid ohu Onyenwe anyị. Ọ bụụrụ Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị: O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m.
למנצח לעבד יהוה--לדוד אשר דבר ליהוה את-דברי השירה הזאת-- ביום הציל-יהוה אותו מכף כל-איביו ומיד שאול ב ויאמר-- ארחמך יהוה חזקי
2 Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya.
יהוה סלעי ומצודתי-- ומפלטי אלי צורי אחסה-בו מגני וקרן-ישעי משגבי
3 Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m.
מהלל אקרא יהוה ומן-איבי אושע
4 Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ; ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.
אפפוני חבלי-מות ונחלי בליעל יבעתוני
5 Ụdọ nke ili kere m gburugburu, ọnya nke ọnwụ guzogidere m. (Sheol h7585)
חבלי שאול סבבוני קדמוני מוקשי מות (Sheol h7585)
6 Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị; etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka; akwa m rutekwara ya ntị, o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
בצר-לי אקרא יהוה-- ואל-אלהי אשוע ישמע מהיכלו קולי ושועתי לפניו תבוא באזניו
7 Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji, ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.
ותגעש ותרעש הארץ-- ומוסדי הרים ירגזו ויתגעשו כי-חרה לו
8 Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta, ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta; icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.
עלה עשן באפו-- ואש-מפיו תאכל גחלים בערו ממנו
9 O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.
ויט שמים וירד וערפל תחת רגליו
10 Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, o feliri elu nʼelu nku nke ifufe.
וירכב על-כרוב ויעף וידא על-כנפי-רוח
11 O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.
ישת חשך סתרו-- סביבותיו סכתו חשכת-מים עבי שחקים
12 Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii ji mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe gabiga.
מנגה נגדו עביו עברו--ברד וגחלי-אש
13 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ; olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
וירעם בשמים יהוה--ועליון יתן קלו ברד וגחלי-אש
14 Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa, o jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.
וישלח חציו ויפיצם וברקים רב ויהמם
15 E kpughere ala ala nke oke osimiri, gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, site nʼịba mba gị, O Onyenwe anyị, na nkuume si gị nʼimi pụta.
ויראו אפיקי מים ויגלו מוסדות תבל מגערתך יהוה-- מנשמת רוח אפך
16 O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.
ישלח ממרום יקחני ימשני ממים רבים
17 Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.
יצילני מאיבי עז ומשנאי כי-אמצו ממני
18 Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m, ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.
יקדמוני ביום-אידי ויהי-יהוה למשען לי
19 Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.
ויוציאני למרחב יחלצני כי חפץ בי
20 Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị; ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.
יגמלני יהוה כצדקי כבר ידי ישיב לי
21 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị, ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.
כי-שמרתי דרכי יהוה ולא-רשעתי מאלהי
22 Iwu ya niile dị nʼihu m, esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.
כי כל-משפטיו לנגדי וחקתיו לא-אסיר מני
23 Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.
ואהי תמים עמו ואשתמר מעוני
24 Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, dịka ịdị ọcha nke aka m abụọ si dị nʼanya ya.
וישב-יהוה לי כצדקי כבר ידי לנגד עיניו
25 Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.
עם-חסיד תתחסד עם-גבר תמים תתמם
26 Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.
עם-נבר תתברר ועם-עקש תתפתל
27 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala.
כי-אתה עם-עני תושיע ועינים רמות תשפיל
28 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu, Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
כי-אתה תאיר נרי יהוה אלהי יגיה חשכי
29 Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ, sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.
כי-בך ארץ גדוד ובאלהי אדלג-שור
30 Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.
האל תמים דרכו אמרת-יהוה צרופה מגן הוא לכל החסים בו
31 Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị?
כי מי אלוה מבלעדי יהוה ומי צור זולתי אלהינו
32 Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.
האל המאזרני חיל ויתן תמים דרכי
33 Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele; Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.
משוה רגלי כאילות ועל במתי יעמידני
34 Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.
מלמד ידי למלחמה ונחתה קשת-נחושה זרועתי
35 Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, aka nri gị na-akwagidekwa m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.
ותתן-לי מגן ישעך וימינך תסעדני וענותך תרבני
36 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ, ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.
תרחיב צעדי תחתי ולא מעדו קרסלי
37 Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha; alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.
ארדוף אויבי ואשיגם ולא-אשוב עד-כלותם
38 Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite. Ha dara nʼokpuru ụkwụ m.
אמחצם ולא-יכלו קום יפלו תחת רגלי
39 Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha, i wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.
ותאזרני חיל למלחמה תכריע קמי תחתי
40 I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ. Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị.
ואיבי נתתה לי ערף ומשנאי אצמיתם
41 Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.
ישועו ואין-מושיע על-יהוה ולא ענם
42 Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu; a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ.
ואשחקם כעפר על-פני-רוח כטיט חוצות אריקם
43 Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ ị meela m onyeisi nke ọtụtụ mba; ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.
תפלטני מריבי-עם תשימני לראש גוים עם לא-ידעתי יעבדוני
44 Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.
לשמע אזן ישמעו לי בני-נכר יכחשו-לי
45 Obi na-ada ha mba; ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.
בני-נכר יבלו ויחרגו ממסגרותיהם
46 Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m! Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m.
חי-יהוה וברוך צורי וירום אלוהי ישעי
47 Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ, onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m,
האל--הנותן נקמות לי וידבר עמים תחתי
48 onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro, napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.
מפלטי מאיבי אף מן-קמי תרוממני מאיש חמס תצילני
49 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche, aga m abụku aha gị abụ otuto.
על-כן אודך בגוים יהוה ולשמך אזמרה
50 Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu; Ọ na-egosikwa onye ya onye e tere mmanụ ịhụnanya na-adịghị ada ada, nye Devid na ndị agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
מגדל ישועות מלכו ועשה חסד למשיחו--לדוד ולזרעו עד-עולם

< Abụ Ọma 18 >