< Abụ Ọma 17 >

1 Ekpere Devid. O Onyenwe anyị, nụrụ arịrịọ m ziri ezi, nụrụkwa mkpu akwa m. Gee ntị nʼekpere m nʼihi na o siteghị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu okwu aghụghọ.
Sala ya Daudi. Sikia, Ee Bwana, kusihi kwangu kwa haki, sikiliza kilio changu. Tega sikio kwa ombi langu, halitoki kwenye midomo ya udanganyifu.
2 Ka mkpepụta m si nʼaka gị bịa; ka anya gị hụ ihe ziri ezi.
Hukumu yangu na itoke kwako, macho yako na yaone yale yaliyo haki.
3 Ọ bụ ezie na ị nyochaala obi m, i letala m nʼabalị, nwalekwaa m, ị ga-achọpụta na o nweghị ihe ọ ọjọọ bụla m zubere, na ọnụ m ekwuhiebeghị.
Ingawa unauchunguza moyo wangu na kunikagua usiku, ingawa umenijaribu, hutaona chochote. Nimeamua kwamba kinywa changu hakitatenda dhambi.
4 Ndị mmadụ agbalịala inye m ngarị ma anaghị m ekwe ka mụ na ndị na-eme ihe ike nwee mmekọrịta nʼihi iwu sitere nʼegbugbere ọnụ gị.
Kuhusu matendo ya wanadamu: kwa neno la midomo yako, nimejiepusha na njia za wenye jeuri.
5 Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị, ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya.
Hatua zangu zimeshikamana na njia zako; nyayo zangu hazikuteleza.
6 Ana m akpọku gị, O Chineke, nʼihi na amaara m na ị ga-aza m; gee m ntị ma nụrụ ekpere m.
Ee Mungu, ninakuita, kwa kuwa utanijibu, nitegee sikio lako na usikie ombi langu.
7 Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube; gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha.
Uonyeshe ajabu ya upendo wako mkuu, wewe uokoaye kwa mkono wako wa kuume wale wanaokukimbilia kutokana na adui zao.
8 Chebe m dịka mkpụrụ anya gị; zoo m na ndo nke nku gị,
Nilinde kama mboni ya jicho lako, unifiche chini ya kivuli cha mbawa zako
9 site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu, ọ bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m.
kutokana na waovu wanaonishambulia, kutokana na adui wauaji wanaonizunguka.
10 Ha anaghị eme ebere, ha bụ ndị afọ tara mmiri, okwu ịnya isi juru ha ọnụ.
Huifunga mioyo yao iliyo migumu, vinywa vyao hunena kwa majivuno.
11 Ha achọpụtala ebe m nọ, ugbu a, ha gbara m gburugburu, ha ji anya nkọ, jikerekwa ịtụ m nʼala.
Wamenifuatia nyayo zangu, sasa wamenizingira, wakiwa macho, waniangushe chini.
12 Ha ka ọdụm agụụ na-agụ nke zoro onwe ya nʼọhịa, dịka ọdụm dị ike na-eche ihe ọ ga-adọgbu.
Wamefanana na simba mwenye njaa awindaye, kama simba mkubwa anyemeleaye mafichoni.
13 Onyenwe anyị, bilie guzogide ha, tigbuo ha. Jiri mma agha gị zọpụta m site nʼaka ndị ajọ omume.
Inuka, Ee Bwana, pambana nao, uwaangushe, niokoe kutokana na waovu kwa upanga wako.
14 O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼaka ndị dị otu a, site nʼaka ndị ụgwọ ọrụ ha bụ nʼụwa a. Ka ihe ịkpakọbara debere ndị ajọ omume jupụta afọ ha, ka afọ jukwa ụmụ site nʼihe ndị a, ka ha hapụrụ ihe fọdụrụ nye ụmụntakịrị ha.
Ee Bwana, mkono wako uniokoe na watu wa jinsi hii, kutokana na watu wa ulimwengu huu ambao fungu lao liko katika maisha haya. Na wapate adhabu ya kuwatosha. Watoto wao na wapate zaidi ya hayo, hukumu na iendelee kwa watoto wa watoto wao.
15 Ma mụ onwe m ga-ahụ ihu gị site nʼezi omume; mgbe m ga-ebili, afọ ga-eju m nke ọma, nʼihi na aga m ahụ gị ihu na ihu.
Na mimi katika haki nitauona uso wako, niamkapo, nitaridhika kwa kuona sura yako.

< Abụ Ọma 17 >