< Abụ Ọma 16 >
1 Abụ miktam nke Devid. Chebe m, O Chineke, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ.
Miktamu ti Dafidi. Pa mí mọ́, Ọlọ́run, nítorí nínú rẹ ni ààbò mi wà.
2 A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m, e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.”
Mo sọ fún Olúwa, “Ìwọ ni Olúwa mi, lẹ́yìn rẹ èmi kò ní ìre kan.”
3 Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a, “Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ.”
Sí àwọn ènìyàn tí ó wà ní ayé, àwọn ni ológo nínú èyí tí ayọ̀ mí wà.
4 Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba. Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara nye chi ndị a, maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha.
Ìṣòro àwọn wọ̀n-ọn-nì yóò pọ̀ sí i, àní àwọn tí ń tọ ọlọ́run mìíràn lẹ́yìn. Ẹbọ ohun mímu ẹ̀jẹ̀ wọn ni èmi kì yóò ta sílẹ̀, bẹ́ẹ̀ ni èmi kì yóò dá orúkọ wọn lẹ́nu mi.
5 Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m; ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza.
Olúwa, ni ìpín ìní mi tí mo yàn àti ago mi, ó ti pa ohun tí í ṣe tèmi mọ́.
6 Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma; nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.
Okùn ààlà ilẹ̀ ti bọ́ sí ọ̀dọ̀ mi ní ibi dídára; nítòótọ́ mo ti ní ogún rere.
7 Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ; ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme.
Èmi yóò yin Olúwa, ẹni tí ó gbà mí ní ìyànjú; ní òru, ọkàn mí ń bá mi sọ̀rọ̀.
8 Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile. Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.
Mo ti gbé Olúwa síwájú mi ní ìgbà gbogbo. Nítorí tí ó wà ní ọwọ́ ọ̀tún mi, a kì yóò mì mí.
9 Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ; aga m anọkwa nʼudo.
Nítorí èyí, ọkàn mi yọ̀, ahọ́n mi pẹ̀lú ń fò fáyọ̀; ara mi pẹ̀lú yóò sinmi ní ààbò,
10 Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure. (Sheol )
nítorí ìwọ kò ní fi ọ̀kan sílẹ̀ nínú isà òkú, tàbí kí ìwọ jẹ́ kí ẹni mímọ́ rẹ kí ó rí ìdíbàjẹ́. (Sheol )
11 I gosila m ụzọ ndụ; ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị; ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.
Ìwọ ti fi ipa ọ̀nà ìyè hàn mí; Ìwọ yóò kún mi pẹ̀lú ayọ̀ ní iwájú rẹ, pẹ̀lú ìdùnnú ayérayé ní ọwọ́ ọ̀tún rẹ.