< Abụ Ọma 16 >

1 Abụ miktam nke Devid. Chebe m, O Chineke, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ.
Michtam of David. Preserve me, O God: for in thee do I put my trust.
2 A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m, e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.”
I have said unto the LORD, Thou art my Lord: I have no good beyond thee.
3 Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a, “Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ.”
As for the saints that are in the earth, they are the excellent in whom is all my delight.
4 Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba. Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara nye chi ndị a, maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha.
Their sorrows shall be multiplied that exchange [the LORD] for another [god]: their drink offerings of blood will I not offer, nor take their names upon my lips.
5 Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m; ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza.
The LORD is the portion of mine inheritance and of my cup: thou maintainest my lot.
6 Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma; nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.
The lines are fallen unto me in pleasant places; yea, I have a goodly heritage.
7 Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ; ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme.
I will bless the LORD, who hath given me counsel: yea, my reins instruct me in the night seasons.
8 Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile. Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.
I have set the LORD always before me: because he is at my right hand, I shall not be moved.
9 Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ; aga m anọkwa nʼudo.
Therefore my heart is glad, and my glory rejoiceth: my flesh also shall dwell in safety.
10 Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure. (Sheol h7585)
For thou wilt not leave my soul to Sheol; neither wilt thou suffer thine holy one to see corruption. (Sheol h7585)
11 I gosila m ụzọ ndụ; ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị; ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.
Thou wilt shew me the path of life: in thy presence is fulness of joy; in thy right hand there are pleasures for evermore.

< Abụ Ọma 16 >