< Abụ Ọma 150 >

1 Toonu Onyenwe anyị. Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya. Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.
할렐루야 그 성소에서 하나님을 찬양하며 그 권능의 궁창에서 그를 찬양할지어다
2 Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya. Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.
그의 능하신 행동을 인하여 찬양하며 그의 지극히 광대하심을 좇아 찬양할지어다
3 Werenụ opi ike too ya, werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,
나팔 소리로 찬양하며 비파와 수금으로 찬양할지어다
4 jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya, jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,
소고 치며 춤추어 찬양하며 현악과 퉁소로 찬양할지어다
5 werenụ ogene too ya, werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.
큰 소리 나는 제금으로 찬양하며 높은 소리 나는 제금으로 찬양할지어다
6 Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị.
호흡이 있는 자마다 여호와를 찬양할지어다 할렐루야

< Abụ Ọma 150 >