< Abụ Ọma 150 >

1 Toonu Onyenwe anyị. Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya. Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya. 2 Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya. Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile. 3 Werenụ opi ike too ya, werekwanụ ụbọ akwara na une too ya, 4 jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya, jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya, 5 werenụ ogene too ya, werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya. 6 Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị.

< Abụ Ọma 150 >