< Abụ Ọma 149 >

1 Toonu Onyenwe anyị! Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ. Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya.
Msifuni Yahwe. Mwimbieni Yahwe wimbo mpya; imbeni sifa zake katika kusanyiko la waaminifu.
2 Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha; ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze ha.
Israeli ishangilie katika yeye aliye iumba; watu wa Sayuni na washangilie katika mfalme wao.
3 Ka ha jiri ite egwu too aha ya ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.
Nao walisifu jina lake kwa kucheza; na wamuimbie sifa yeye kwa ngoma na kinubi.
4 Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ. Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze.
Kwa kuwa Yahwe hupata furaha katika watu wake; huwapa utukufu wanyeyekevu kwa wokovu.
5 Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a, bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha.
Wacha Mungu wauchangilie ushindi; nao waimbe kwa furaha vitandani mwao.
6 Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha, ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha,
Sifa za Mungu na ziwe vinywani mwao na panga mbili zenye makali mkononi mwao
7 iji bọọrọ mba niile ọbọ taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ,
kutekeleza kisasi juu ya mataifa na matendo ya adhabu juu ya watu.
8 iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe,
Nao watawafunga wafalme wao kwa minyororo na wakuu wao kwa pingu za chuma. Watatekeleza hukumu ambayo imeandikwa.
9 imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha. Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya. Toonu Onyenwe anyị.
Hii itakuwa ni heshima kwa ajili ya watakatifu wake wote. Msifuni Yahwe.

< Abụ Ọma 149 >