< Abụ Ọma 149 >

1 Toonu Onyenwe anyị! Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ. Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya.
הללו-יה שירו ליהוה שיר חדש תהלתו בקהל חסידים
2 Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha; ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze ha.
ישמח ישראל בעשיו בני-ציון יגילו במלכם
3 Ka ha jiri ite egwu too aha ya ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.
יהללו שמו במחול בתף וכנור יזמרו-לו
4 Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ. Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze.
כי-רוצה יהוה בעמו יפאר ענוים בישועה
5 Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a, bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha.
יעלזו חסידים בכבוד ירננו על-משכבותם
6 Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha, ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha,
רוממות אל בגרונם וחרב פיפיות בידם
7 iji bọọrọ mba niile ọbọ taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ,
לעשות נקמה בגוים תוכחות בלאמים
8 iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe,
לאסר מלכיהם בזקים ונכבדיהם בכבלי ברזל
9 imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha. Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya. Toonu Onyenwe anyị.
לעשות בהם משפט כתוב-- הדר הוא לכל-חסידיו הללו-יה

< Abụ Ọma 149 >