< Abụ Ọma 148 >

1 Toonu Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị site nʼeluigwe, toonu ya nʼebe niile kachasị elu.
할렐루야! 하늘에서 여호와를 찬양하며 높은 데서 찬양할지어다!
2 Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile, toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile.
그의 모든 사자여 찬양하며 모든 군대여 찬양할지어다!
3 Toonu ya, anyanwụ na ọnwa toonu ya, kpakpando niile.
해와 달아 찬양하며 광명한 별들아 찬양할지어다!
4 Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe.
하늘의 하늘도 찬양하며 하늘 위에 있는 물들도 찬양할지어다!
5 Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya.
그것들이 여호와의 이름을 찬양할 것은 저가 명하시매 지음을 받았음이로다
6 O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi; o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga.
저가 또 그것들을 영영히 세우시고 폐치 못할 명을 정하셨도다
7 Toonu Onyenwe anyị, site nʼụwa, unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile,
너희 용들과 바다여 땅에서 여호와를 찬양하라!
8 na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile, na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu,
불과 우박과 눈과 안개와 그 말씀을 좇는 광풍이며
9 unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile
산들과 모든 작은 산과 과목과 모든 백향목이며
10 na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile, na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile,
짐승과 모든 가축과 기는 것과 나는 새며
11 ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa,
세상의 왕들과 모든 백성과 방백과 땅의 모든 사사며
12 ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, ndị okenye na ụmụntakịrị.
청년 남자와 처녀와 노인과 아이들아
13 Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu; ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa.
다 여호와의 이름을 찬양할지어다 그 이름이 홀로 높으시며 그 영광이 천지에 뛰어나심이로다
14 O meela ka mpi ndị ya dị elu, otuto ndị nsọ ya niile, nke Izrel ndị ọ hụrụ nʼanya. Toonu Onyenwe anyị.
저가 그 백성의 뿔을 높이셨으니 저는 모든 성도 곧 저를 친근히 하는 이스라엘 자손의 찬양거리로다 할렐루야!

< Abụ Ọma 148 >