< Abụ Ọma 147 >

1 Toonu Onyenwe anyị! Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto. Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya!
Louvai ao SENHOR, porque é bom cantar louvores ao nosso Deus; porque agradável e merecido [é] o louvor.
2 Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem: ọ na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ.
O SENHOR edifica a Jerusalém; [e] ajunta os dispersos de Israel.
3 Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.
Ele sara aos de coração partido, e os cura de suas dores.
4 Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile na-akpọkwa ha nʼotu na otu.
Ele conta o número das estrelas; chama todas elas pelos seus nomes.
5 Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu; nghọta ya enweghị nsọtụ.
O nosso Senhor é grande e muito poderoso; seu entendimento é incomensurável.
6 Onyenwe anyị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume ma ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala.
O SENHOR levanta aos mansos; [e] abate aos perversos até a terra.
7 Jirinụ ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ; jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu.
Cantai ao SENHOR em agradecimento; cantai louvores ao nosso Deus com harpa.
8 Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe; ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile.
Ele que cobre o céu com nuvens, que prepara chuva para a terra, que faz os montes produzirem erva;
9 Ọ na-enye ehi niile nri na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri.
Que dá ao gado seu pasto; e [também] aos filhos dos corvos, quando clamam.
10 Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya, maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ.
Ele não se agrada da força do cavalo, nem se contenta com as pernas do homem.
11 Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.
O SENHOR se agrada dos que o temem, daqueles que esperam por sua bondade.
12 O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma; o Zayọn, too Chineke gị.
Louva, Jerusalém, ao SENHOR; celebra ao teu Deus, ó Sião.
13 Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike, na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị.
Porque ele fortifica os ferrolhos de tuas portas; ele abençoa a teus filhos dentro de ti.
14 Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo, jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ.
[Ele é] o que dá paz às tuas fronteiras; e te farta com o melhor trigo;
15 Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; okwu ya na-agbasa ngwangwa.
Que envia sua ordem à terra; sua palavra corre velozmente.
16 Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ, na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ.
Que dá a neve como a lã; espalha a geada como a cinza.
17 Ọ na-atụdata mkpụrụ mmiri ya dị ka mkpụrụ okwute. Onye pụrụ iguzogide oke ifufe oyi ya?
Que lança seu gelo [em] pedaços; quem pode subsistir ao seu frio?
18 Ọ na-ezipụ okwu ya na-agbaze ha; ọ na-akpalịte ikuku ya mee ka mmiri bido ịsọgharị.
Ele manda sua palavra, e os faz derreter; faz soprar seu vento, [e] escorrem-se as águas.
19 O kpugheela okwu ya nye Jekọb, iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel.
Ele declara suas palavras a Jacó; e seus estatutos e seus juízos a Israel.
20 O mesobeghị mba ọzọ ụdị mmeso dị otu a. Ha amakwaghị iwu ya niile. Toonu Onyenwe anyị!
Ele não fez assim a nenhuma [outra] nação; [e] não conhecem os juízos [dele]. Louvai ao SENHOR.

< Abụ Ọma 147 >