< Abụ Ọma 146 >

1 Toonu Onyenwe anyị. O mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.
Alleluia, [a Psalm] of Aggaeus and Zacharias. My soul, praise the Lord.
2 Aga m eto Onyenwe anyị ogologo ndụ m niile; aga m abụ abụ otuto nye Chineke m mgbe m nọ na-adị ndụ.
While I live will I praise the Lord: I will sing praises to my God as long as I exist.
3 Atụkwasịla ụmụ eze obi gị, ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta.
Trust not in princes, nor in the children of men, in whom there is no safety.
4 Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja; nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu.
His breath shall go forth, and he shall return to his earth; in that day all his thoughts shall perish.
5 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb, onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya.
Blessed is he whose helper is the God of Jacob, whose hope is in the Lord his God:
6 Onye kere eluigwe na ụwa, na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha, Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
who made heaven, and earth, the sea, and all things in them: who keeps truth for ever:
7 Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri. Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha,
who executes judgement for the wronged: who gives food to the hungry. The Lord looses the fettered ones:
8 Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì, Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba, Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya.
the Lord gives wisdom to the blind: The Lord sets up the broken down: the Lord loves the righteous: the Lord preserves the strangers;
9 Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa, na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ, ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma.
he will relieve the orphan and widow: but will utterly remove the way of sinners.
10 Onyenwe anyị na-achị ruo ebighị ebi, Chineke gị, o Zayọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Toonu Onyenwe anyị.
The Lord shall reign for ever, [even] your God, O Sion, to all generations.

< Abụ Ọma 146 >