< Abụ Ọma 145 >

1 Abụ Ọma otuto, nke Devid. Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze; aga m eto aha gị, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
Masanzoli. Nzembo ya Davidi. Nakotombola Yo, Nzambe na ngai, Mokonzi na ngai; nakopambola Kombo na Yo seko na seko.
2 Ụbọchị niile ka m ga-eto gị jaakwa aha gị mma site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
Mikolo nyonso, nakopambola Yo mpe nakokumisa Kombo na Yo libela na libela.
3 Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta.
Yawe azali monene, abongi na lokumu; moko te akoki komeka mozindo ya monene na Ye.
4 Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ; ha ga-ekwupụta maka ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.
Bikeke nyonso ekotombola kitoko ya misala na Yo mpe ekopanza sango ya misala na Yo ya minene.
5 Ha ga-ekwupụta ihe banyere ịdị ebube nke ịma mma gị, aga m atụgharịkwa uche nʼọrụ ebube gị niile.
Nakolemba te kotatola bikamwa na Yo mpe kongenga makasi ya nkembo na Yo.
6 Ha ga-ekwupụta ihe banyere ike nke ọrụ ịtụnanya gị niile, aga m ekwusakwa ọrụ ukwuu gị niile.
Bakolobela nguya na Yo ya somo, mpe ngai, nakosakola misala na Yo ya minene.
7 Ha ga-eme mmemme nʼihi ịdị mma gị dị ukwuu jirikwa ọṅụ bụọ abụ banyere ezi omume gị.
Bakokanisa misala minene ya bolamu na Yo, bakobetela bosembo na Yo maboko.
8 Onyenwe anyị na-eme amara nweekwa obi ọmịiko, ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, ọ bara ụba nʼịhụnanya.
Yawe atonda na ngolu mpe na mawa, asilikaka noki te mpe atonda na bolingo.
9 Onyenwe anyị dị mma nʼebe mmadụ niile dị; o nwere ọmịiko nʼebe ihe niile o kere eke dị.
Yawe azali malamu mpo na bato nyonso, atonda na mawa mpo na bikelamu na Ye nyonso.
10 O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma.
Yawe, misala na Yo nyonso ekumisaka Yo! Tika ete bayengebene na Yo bapambola Yo!
11 Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị,
Bazali koloba ete bokonzi na Yo etondi na nkembo mpe bazali kopanza sango ya misala ya nguya na Yo.
12 ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị.
Bazali koyebisa bato misala na Yo ya minene mpe kongenga ya nkembo ya bokonzi na Yo.
13 Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
Ozali Mokonzi seko na seko, mpe bokonzi na Yo ekowumela libela na libela. Yawe akokisaka bilaka na Ye nyonso, asalaka nyonso na bolingo.
14 Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada na-akwagide ndị niile dara mba.
Yawe alendisaka bato nyonso oyo bakweyaka, atelemisaka bato nyonso oyo balembaka.
15 Olileanya ihe niile dị na gị, ị na-enye ha nri ha mgbe oge ya ruru.
Na bato nyonso oyo batalelaka Yo, opesaka bilei na tango oyo ekoki.
16 I na-asaghepụ aka gị na-emezu ọchịchọ ihe niile dị ndụ.
Ofungolaka loboko na Yo mpe okokisaka posa ya nyonso oyo ezali na bomoi.
17 Ụzọ Onyenwe anyị niile ziri ezi; ọ na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
Yawe azali sembo na nyonso oyo asalaka mpe atonda na bolingo kati na misala na Ye nyonso.
18 Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya, bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu.
Yawe azali pene ya bato nyonso oyo babelelaka Ye, ya bato nyonso oyo babelelaka Ye na solo;
19 Ọ na-emezu ọchịchọ niile nke ndị na-atụ egwu ya; ọ na-anụ akwa ha na-azọpụtakwa ha.
akokisaka posa ya bato oyo batosaka Ye, ayokaka mpe abikisaka bango tango babelelaka Ye.
20 Onyenwe anyị na-echebe ndị niile hụrụ ya nʼanya, ma ọ ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi.
Yawe abatelaka bato nyonso oyo balingaka Ye, kasi abebisaka bato nyonso ya mabe.
21 Ọnụ m ga-ekwupụta otuto Onyenwe anyị; ka ihe niile e kere eke too aha nsọ ya ruo mgbe ebighị ebi.
Tika ete monoko na ngai ekumisa Yawe! Tika ete bikelamu nyonso epambola Kombo na Ye ya bule libela na libela!

< Abụ Ọma 145 >