< Abụ Ọma 145 >
1 Abụ Ọma otuto, nke Devid. Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze; aga m eto aha gị, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
A psalm of praise. Of David. I will extol you, my God, King; I will bless your name forever and ever.
2 Ụbọchị niile ka m ga-eto gị jaakwa aha gị mma site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
Every day will I bless you; I will praise your name forever and ever.
3 Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta.
Great is Yahweh and greatly to be praised; his greatness is unsearchable.
4 Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ; ha ga-ekwupụta maka ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.
One generation will praise your deeds to the next and will proclaim your mighty actions.
5 Ha ga-ekwupụta ihe banyere ịdị ebube nke ịma mma gị, aga m atụgharịkwa uche nʼọrụ ebube gị niile.
I will meditate on the majesty of your glory and on your marvelous deeds.
6 Ha ga-ekwupụta ihe banyere ike nke ọrụ ịtụnanya gị niile, aga m ekwusakwa ọrụ ukwuu gị niile.
They will speak of the power of your awesome works, and I will declare your greatness.
7 Ha ga-eme mmemme nʼihi ịdị mma gị dị ukwuu jirikwa ọṅụ bụọ abụ banyere ezi omume gị.
They will declare your abounding goodness, and they will sing about your righteousness.
8 Onyenwe anyị na-eme amara nweekwa obi ọmịiko, ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, ọ bara ụba nʼịhụnanya.
Yahweh is gracious and merciful, slow to anger and abounding in covenant faithfulness.
9 Onyenwe anyị dị mma nʼebe mmadụ niile dị; o nwere ọmịiko nʼebe ihe niile o kere eke dị.
Yahweh is good to all; his tender mercies are over all his works.
10 O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma.
All you have made will give thanks to you, Yahweh; your faithful ones will bless you.
11 Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị,
Your faithful ones will speak of the glory of your kingdom, and they will tell of your power.
12 ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị.
They will make known to mankind God's mighty deeds and the glorious splendor of his kingdom.
13 Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
Your kingdom is an everlasting kingdom, and your dominion endures throughout all generations.
14 Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada na-akwagide ndị niile dara mba.
Yahweh supports all who are falling and raises up all those who are bent over.
15 Olileanya ihe niile dị na gị, ị na-enye ha nri ha mgbe oge ya ruru.
The eyes of all wait for you; you give them their food at the right time.
16 I na-asaghepụ aka gị na-emezu ọchịchọ ihe niile dị ndụ.
You open your hand and satisfy the desire of every living thing.
17 Ụzọ Onyenwe anyị niile ziri ezi; ọ na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
Yahweh is righteous in all his ways and gracious in all he does.
18 Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya, bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu.
Yahweh is near to all those who call to him, to all who call to him in trustworthiness.
19 Ọ na-emezu ọchịchọ niile nke ndị na-atụ egwu ya; ọ na-anụ akwa ha na-azọpụtakwa ha.
He fulfills the desire of those who honor him; he hears their cry and saves them.
20 Onyenwe anyị na-echebe ndị niile hụrụ ya nʼanya, ma ọ ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi.
Yahweh watches over all those who love him, but he will destroy all the wicked.
21 Ọnụ m ga-ekwupụta otuto Onyenwe anyị; ka ihe niile e kere eke too aha nsọ ya ruo mgbe ebighị ebi.
My mouth will speak out the praise of Yahweh; let all mankind bless his holy name forever and ever.