< Abụ Ọma 143 >

1 Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m, gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka amara; nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị na ezi omume gị, bịa nyere m aka.
Saamu ti Dafidi. Olúwa gbọ́ àdúrà mi, fetísí igbe mi fún àánú; nínú òtítọ́ àti òdodo rẹ, wá fún ìrànlọ́wọ́ mi.
2 Edubatala m nʼọnọdụ ikpe m ikpe, nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla dị ndụ bụ onye ezi omume nʼihu gị.
Má ṣe mú ìránṣẹ́ rẹ wá sí ìdájọ́, nítorí kò sí ẹnìkan tí ó wà láààyè tí ó ṣe òdodo níwájú rẹ.
3 Onye iro na-achụ m ọsọ, ọ na-azọpịa ndụ m nʼala; na-emekwa ka m nọdụ nʼọchịchịrị, dịka ndị nwụrụ anwụ nʼogologo oge gara aga.
Ọ̀tá ń lépa mi, ó fún mi pamọ́ ilẹ̀; ó mú mi gbé nínú òkùnkùn bí àwọn tí ó ti kú ti pẹ́.
4 Ya mere mmụọ m na-ada mba nʼime m ụjọ jupụtakwara m nʼobi.
Nítorí náà ẹ̀mí mi ṣe rẹ̀wẹ̀sì nínú mi; ọkàn mi nínú mi ṣì pòruurù.
5 Ana m echeta ụbọchị niile ndị ahụ gara aga; ana m atụgharị uche nʼọrụ gị niile na-echekwa echiche banyere ihe niile aka gị rụrụ.
Èmi rántí ọjọ́ tí ó ti pẹ́; èmi ń ṣe àṣàrò lórí gbogbo iṣẹ́ rẹ mo sì ṣe àkíyèsí ohun tí ọwọ́ rẹ ti ṣe.
6 Ana m agbasa aka m abụọ nye gị; agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ. (Sela)
Èmi na ọwọ́ mi jáde sí ọ: òǹgbẹ rẹ gbẹ ọkàn mi bí i ìyàngbẹ ilẹ̀. (Sela)
7 O Onyenwe anyị, zaa m ọsịịsọ; mmụọ m na-ada mba. Ezonarịla m ihu gị, ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili.
Dá mi lóhùn kánkán, Olúwa; ó rẹ ẹ̀mí mi tán. Má ṣe pa ojú rẹ mọ́ kúrò lára mi kí èmi má ba à dàbí àwọn tí ó lọ sínú ihò.
8 Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ, nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi. Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso, nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye.
Mú mi gbọ́ ìṣeun ìfẹ́ rẹ ní òwúrọ̀: nítorí ìwọ ni mo gbẹ́kẹ̀lé. Fi ọ̀nà tí èmi i bá rìn hàn mí, nítorí èmi gbé ọkàn mi sókè sí ọ.
9 O Onyenwe anyị, gbapụta m site nʼaka ndị iro m, nʼihi na ọ bụ nʼime gị ka m na-ezo onwe m.
Gbà mí kúrò lọ́wọ́ àwọn ọ̀tá mi, Olúwa, nítorí èmi fi ara mi pamọ́ sínú rẹ.
10 Kuziere m ime uche gị, nʼihi na ị bụ Chineke m; ka ezi Mmụọ gị duo m nʼala dị larịị.
Kọ́ mi láti ṣe ìfẹ́ rẹ, nítorí ìwọ ni Ọlọ́run mi jẹ́ kí ẹ̀mí rẹ dídára darí mi sí ilẹ̀ tí ó tẹ́jú.
11 O Onyenwe anyị, nʼihi aha gị chebe ndụ m; nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu.
Nítorí orúkọ rẹ, Olúwa, sọ mi di ààyè; nínú òdodo rẹ, mú ọkàn mi jáde nínú wàhálà.
12 Nʼime ịhụnanya gị na-adịghị agharịpụ, kpochapụ ndị iro m; laa ndị niile kpọrọ m asị nʼiyi, nʼihi na abụ m ohu gị.
Nínú ìfẹ́ rẹ tí kì í kùnà, ké àwọn ọ̀tá mi kúrò, run gbogbo àwọn tí ń ni ọkàn mi lára, nítorí pé èmi ni ìránṣẹ́ rẹ.

< Abụ Ọma 143 >