< Abụ Ọma 143 >

1 Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m, gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka amara; nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị na ezi omume gị, bịa nyere m aka.
大卫的诗。 耶和华啊,求你听我的祷告, 留心听我的恳求, 凭你的信实和公义应允我。
2 Edubatala m nʼọnọdụ ikpe m ikpe, nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla dị ndụ bụ onye ezi omume nʼihu gị.
求你不要审问仆人; 因为在你面前,凡活着的人没有一个是义的。
3 Onye iro na-achụ m ọsọ, ọ na-azọpịa ndụ m nʼala; na-emekwa ka m nọdụ nʼọchịchịrị, dịka ndị nwụrụ anwụ nʼogologo oge gara aga.
原来仇敌逼迫我, 将我打倒在地, 使我住在幽暗之处, 像死了许久的人一样。
4 Ya mere mmụọ m na-ada mba nʼime m ụjọ jupụtakwara m nʼobi.
所以,我的灵在我里面发昏; 我的心在我里面凄惨。
5 Ana m echeta ụbọchị niile ndị ahụ gara aga; ana m atụgharị uche nʼọrụ gị niile na-echekwa echiche banyere ihe niile aka gị rụrụ.
我追想古时之日, 思想你的一切作为, 默念你手的工作。
6 Ana m agbasa aka m abụọ nye gị; agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ. (Sela)
我向你举手; 我的心渴想你, 如干旱之地盼雨一样。 (细拉)
7 O Onyenwe anyị, zaa m ọsịịsọ; mmụọ m na-ada mba. Ezonarịla m ihu gị, ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili.
耶和华啊,求你速速应允我! 我心神耗尽! 不要向我掩面, 免得我像那些下坑的人一样。
8 Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ, nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi. Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso, nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye.
求你使我清晨得听你慈爱之言, 因我倚靠你; 求你使我知道当行的路, 因我的心仰望你。
9 O Onyenwe anyị, gbapụta m site nʼaka ndị iro m, nʼihi na ọ bụ nʼime gị ka m na-ezo onwe m.
耶和华啊,求你救我脱离我的仇敌! 我往你那里藏身。
10 Kuziere m ime uche gị, nʼihi na ị bụ Chineke m; ka ezi Mmụọ gị duo m nʼala dị larịị.
求你指教我遵行你的旨意, 因你是我的 神。 你的灵本为善; 求你引我到平坦之地。
11 O Onyenwe anyị, nʼihi aha gị chebe ndụ m; nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu.
耶和华啊,求你为你的名将我救活, 凭你的公义,将我从患难中领出来,
12 Nʼime ịhụnanya gị na-adịghị agharịpụ, kpochapụ ndị iro m; laa ndị niile kpọrọ m asị nʼiyi, nʼihi na abụ m ohu gị.
凭你的慈爱剪除我的仇敌, 灭绝一切苦待我的人, 因我是你的仆人。

< Abụ Ọma 143 >