< Abụ Ọma 142 >

1 Abụ maskil nke Devid. Mgbe ọ nọ nʼọgba nkume. Ekpere. Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa; ewelitara m olu m rịọ Onyenwe anyị ka o meere m ebere.
Ndakatulo ya Davide, pamene iyeyo anali mʼphanga. Pemphero. Ndikulirira Yehova mofuwula; ndikukweza mawu anga kwa Yehova kupempha chifundo.
2 Ekwupụtara m ihe na-esogbu m nʼihu ya, gwakwa ya ahụhụ nke m nọ nʼime ya.
Ndikukhuthula madandawulo anga pamaso pake; ndikufotokoza za masautso anga pamaso pake.
3 Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m, ọ bụ gị maara ụzọ m. Nʼụzọ ebe m na-esi aga ka ndị mmadụ siiri m ọnya.
Pamene mzimu wanga walefuka mʼkati mwanga, ndinu amene mudziwa njira yanga. Mʼnjira imene ndimayendamo anthu anditchera msampha mobisa.
4 Lee anya nʼaka nri m ma hụ na ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m. Enweghị m ebe mgbaba. Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi.
Yangʼanani kumanja kwanga ndipo onani; palibe amene akukhudzika nane. Ndilibe pothawira; palibe amene amasamala za moyo wanga.
5 Ana m etiku gị mkpu akwa, o Onyenwe anyị, na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m, oke m nʼala ndị dị ndụ.”
Ndilirira Inu Yehova; ndikuti, “Ndinu pothawirapo panga, gawo langa mʼdziko la anthu amoyo.”
6 Gee ntị na mkpu akwa m, nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike; gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ, nʼihi na ha siri ike karịa m.
Mverani kulira kwanga pakuti ndathedwa nzeru; pulumutseni kwa amene akundithamangitsa pakuti ndi amphamvu kuposa ine.
7 Mee ka m nwere onwe m site nʼụlọ mkpọrọ, ka m nwee ike too aha gị. Mgbe ahụ ndị ezi omume ga-agba m gburugburu nʼihi ịdị mma gị nʼebe m nọ.
Tulutseni mʼndende yanga kuti nditamande dzina lanu. Ndipo anthu olungama adzandizungulira chifukwa cha zabwino zanu pa ine.

< Abụ Ọma 142 >