< Abụ Ọma 141 >
1 Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ. Nụrụ olu m mgbe m na-akpọku gị.
Nzembo ya Davidi. Yawe, nazali kobelela Yo; yaka noki epai na ngai! Yoka mongongo na ngai, wana nazali kobelela Yo!
2 Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ; ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị.
Liboso na Yo, tika ete libondeli na ngai ezala lokola mbeka ya malasi, mpe botombwami ya maboko na ngai ezala lokola mbeka ya pokwa!
3 Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o Onyenwe anyị; na-echekwa egbugbere ọnụ m nche.
Yawe, kengela monoko na ngai, batela malamu ekuke ya bibebu na ngai!
4 Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ, isonye ndị na-eme ihe ọjọọ rụọ ọrụ ajọ omume niile dị iche iche; ekwela ka m soro ha rikọọ ihe ụtọ ha niile.
Kotindika motema na ngai te na mabe, mpo ete namipesa te na mobulu elongo na bato ya misala mabe mpe nalia bilei te elongo na bango.
5 Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere; ka ọ baara m mba, nke a bụ mmanụ nʼelu isi m. Isi m agaghị ajụ ya. Otu ọ dị, ekpere m na-emegide ọrụ niile nke ndị na-eme ihe ọjọọ.
Soki moto ya sembo abeti ngai, ezali elembo ya bolingo; soki apameli ngai, ezali mafuta na moto na ngai; moto na ngai ekoboya yango te. Kasi libondeli na ngai ekotelemelaka bato ya misala mabe.
6 A ga-esite nʼelu nkume dị elu tụda ndị na-achị ha, mgbe ahụ, ndị ajọ omume ga-amata na okwu m niile bụ eziokwu.
Tika ete bilombe na bango babwakama na mabanga; na bongo, maloba na ngai ekoyokana, pamba te ezali kitoko.
7 Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala, otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili.” (Sheol )
Lokola tango babalolaka mpe batimolaka mabele, mikuwa na biso epanzani liboso ya mboka ya bakufi. (Sheol )
8 Ma olileanya m dị na gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼime gị ka m gbabara izere ndụ, ararala m nyefee nʼaka ọnwụ.
Yawe, Nkolo na ngai, miso na ngai ebaluki mpo na kotala Yo; nazali kobombama kati na Yo, kotindika ngai na kufa te!
9 Napụta m ka m ghara ịdaba nʼime ọnya igbudu niile nke ndị na-eme ajọ ihe siiri, sitekwa nʼọnya niile ha siiri m.
Batela ngai mpo ete nakangama te na motambo na bango mpe nakweya te na mabulu ya bato ya misala mabe.
10 Ka ndị ajọ omume daba nʼime ụgbụ ha, ma mụ onwe m ga-agabiga na-emerụghị ahụ ọbụla.
Tika ete bato mabe bakangama na mitambo na bango moko, mpe ete ngai naleka na kimia!