< Abụ Ọma 141 >
1 Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ. Nụrụ olu m mgbe m na-akpọku gị.
Psalam. Davidov. Prizivljem te, Jahve, k meni pohitaj! Slušaj glas moj kojim tebi vapijem!
2 Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ; ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị.
Nek' mi se uzdigne molitva kao kad pred lice tvoje, podizanje mojih ruku nek' bude k'o prinos večernji!
3 Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o Onyenwe anyị; na-echekwa egbugbere ọnụ m nche.
Na usta mi, Jahve, stražu postavi i stražare na vrata usana mojih!
4 Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ, isonye ndị na-eme ihe ọjọọ rụọ ọrụ ajọ omume niile dị iche iche; ekwela ka m soro ha rikọọ ihe ụtọ ha niile.
Ne daj da mi se srce zlu prikloni, da bezbožno počinim djela opaka; i u društvu zlotvora da ne blagujem poslastica njihovih!
5 Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere; ka ọ baara m mba, nke a bụ mmanụ nʼelu isi m. Isi m agaghị ajụ ya. Otu ọ dị, ekpere m na-emegide ọrụ niile nke ndị na-eme ihe ọjọọ.
Nek' me samo udari pravednik, ljubav je što me kara, al' ulje grešničko neće mi glavu pomazat'; zloći njihovoj oprijet ću se uvijek svojom molitvom.
6 A ga-esite nʼelu nkume dị elu tụda ndị na-achị ha, mgbe ahụ, ndị ajọ omume ga-amata na okwu m niile bụ eziokwu.
Kad strovale niz hridinu suce njihove, razumjet će kako blage bjehu riječi moje.
7 Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala, otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili.” (Sheol )
Kao kad orač ore i para zemlju, tako će im se na rubu Podzemlja kosti rasuti. (Sheol )
8 Ma olileanya m dị na gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼime gị ka m gbabara izere ndụ, ararala m nyefee nʼaka ọnwụ.
U te su, Jahve, uprte oči moje, k tebi se utječem, ne daj da mi duša propadne!
9 Napụta m ka m ghara ịdaba nʼime ọnya igbudu niile nke ndị na-eme ajọ ihe siiri, sitekwa nʼọnya niile ha siiri m.
Čuvaj me od stupice koju postaviše meni, od zamki zločinaca!
10 Ka ndị ajọ omume daba nʼime ụgbụ ha, ma mụ onwe m ga-agabiga na-emerụghị ahụ ọbụla.
Nek' u vlastite zamke upadnu zlotvori, a ja neka im umaknem!