< Abụ Ọma 140 >
1 Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ. Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche.
Kwa mwimbishaji. Zaburi ya Daudi. Ee Bwana, niokoe, kutoka kwa watu waovu; nilinde na watu wenye jeuri,
2 Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha na-akpali agha ụbọchị niile.
ambao hupanga mipango mibaya mioyoni mwao, na kuchochea vita siku zote.
3 Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ; elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. (Sela)
Wao hufanya ndimi zao kali kama za nyoka, sumu ya nyoka iko midomoni mwao.
4 Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu; chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị na-eche echiche ọdịda m.
Ee Bwana, niepushe na mikono ya waovu; nilinde na watu wenye jeuri wanaopanga kunikwaza miguu yangu.
5 Ndị mpako esielera m ọnya igbudu; ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha, siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. (Sela)
Wenye kiburi wameficha mtego wa kuninasa, wametandaza kamba za wavu wao, wametega mitego kwenye njia yangu.
6 A sịrị m Onyenwe anyị, “Gị onwe gị bụ Chineke m.” Nụrụ, O Onyenwe anyị, olu arịrịọ m maka amara.
Ee Bwana, ninakuambia, “Wewe ni Mungu wangu.” Ee Bwana, usikie kilio changu na kunihurumia.
7 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike, ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha.
Ee Bwana Mwenyezi, Mwokozi wangu mwenye nguvu, unikingaye kichwa changu siku ya vita:
8 Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị, ekwekwala ka nzube ha mezuo. (Sela)
Ee Bwana, usiwape waovu matakwa yao, usiache mipango yao ikafanikiwa, wasije wakajisifu.
9 Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha.
Vichwa vya wanaonizunguka vifunikwe na shida zinazosababishwa na midomo yao.
10 Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha; ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere, nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ.
Makaa ya mawe ya moto na yawaangukie! Na watupwe motoni, katika mashimo ya matope, wasiinuke tena kamwe.
11 Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala, ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike.
Wasingiziaji wasifanikiwe katika nchi; maafa na yawawinde watu wenye jeuri.
12 Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye na-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha.
Najua kwamba Bwana huwapatia maskini haki, na kuitegemeza njia ya mhitaji.
13 Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị, ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.
Hakika wenye haki watalisifu jina lako, na waadilifu wataishi mbele zako.