< Abụ Ọma 14 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ọrụ aka ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.
Mpumbavu husema moyoni mwake, “Hakuna Mungu.” Wamepotoka nakufanya uovu haramu; hakuna hata mmoja atendaye dhambi.
2 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta onye nke na-achọ Chineke.
Yahwe anatazama chini kwa wanadamu kutoka mbinguni aone kama kuna yeyote anayeelewa, amtafutaye Mungu.
3 Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị, otu onye.
Wote wamegeukia njia nyingine. Kwa pamoja wamepotoka. Hakuna yeyote atendaye mema, hakuna, hata mmoja.
4 Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe? Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri, ha adịghị akpọkukwa Onyenwe anyị.
Je, hawajui lolote, wale wafanyao uovu, wale wanao kula watu wangu kama vile wanakula mkate, lakini hao hawamuiti Yahwe?
5 Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu, nʼihi na Chineke nọ nʼetiti ndị ezi omume.
Wao wana tetemeka kwa hofu. Kwa kuwa Mungu yuko pamoja na kusanyiko la wenye haki!
6 Unu ndị ajọ omume na-emebi atụmatụ ndị ogbenye, ma Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba ha.
Ninyi mnataka kumfedhehesha mtu maskini japo kuwa Yahwe ni kimbilio lake.
7 A sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta! Mgbe Onyenwe anyị ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha, ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!
Oh, kwamba wokovu wa Israeli ungetokea Sayuni! Wakati Yahwe akiwarudisha watu wake kutoka utumwani, ndipo Yakobo atashangilia na Israeli itakuwa na furaha!

< Abụ Ọma 14 >