< Abụ Ọma 14 >
1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ọrụ aka ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.
For the chief musician. A psalm of David. A fool says in his heart, “There is no God.” They are corrupt and have done abominable iniquity; there is no one who does good.
2 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta onye nke na-achọ Chineke.
Yahweh looks down from heaven on the children of mankind to see if there are any who understand, who seek after him.
3 Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị, otu onye.
They have all turned away. Together they have become corrupt. There is no one who does good, no, not one.
4 Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe? Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri, ha adịghị akpọkukwa Onyenwe anyị.
Do they not know anything, those who commit iniquity, those who eat up my people as they eat bread, but who do not call on Yahweh?
5 Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu, nʼihi na Chineke nọ nʼetiti ndị ezi omume.
They tremble with dread, for God is with the righteous assembly!
6 Unu ndị ajọ omume na-emebi atụmatụ ndị ogbenye, ma Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba ha.
You want to humiliate the poor person even though Yahweh is his refuge.
7 A sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta! Mgbe Onyenwe anyị ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha, ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!
Oh, that the salvation of Israel would come from Zion! When Yahweh brings back his people from the captivity, then Jacob will rejoice and Israel will be glad!