< Abụ Ọma 139 >

1 Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma
(다윗의 시. 영장으로 한 노래) 여호와여, 주께서 나를 감찰하시고 아셨나이다
2 Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile.
주께서 나의 앉고 일어섬을 아시며 멀리서도 나의 생각을 통촉하시오며
3 Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile.
나의 길과 눕는 것을 감찰하시며 나의 모든 행위를 익히 아시오니
4 O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwu tupu m kwuo ya.
여호와여, 내 혀의 말을 알지 못하시는 것이 하나도 없으시니이다
5 Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ, ị tụkwasịla m aka gị.
주께서 나의 전후를 두르시며 내게 안수하셨나이다
6 Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m, ọ dịkwa elu apụghị m iru ya.
이 지식이 내게 너무 기이하니 높아서 내가 능히 미치지 못하나이다
7 Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị? Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m?
내가 주의 신을 떠나 어디로 가며 주의 앞에서 어디로 피하리이까
8 Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ. Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ. (Sheol h7585)
내가 하늘에 올라갈지라도 거기 계시며 음부에 내 자리를 펼지라도 거기 계시니이다 (Sheol h7585)
9 Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa nʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri,
내가 새벽 날개를 치며 바다 끝에 가서 거할지라도
10 ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m aka nri gị ga-ejidesi m ike.
곧 거기서도 주의 손이 나를 인도하시며 주의 오른손이 나를 붙드시리이다
11 Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m ìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu.”
내가 혹시 말하기를 흑암이 정녕 나를 덮고 나를 두른 빛은 밤이 되리라 할지라도
12 Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ; abalị ga-enye ìhè dịka ehihie, nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.
주에게서는 흑암이 숨기지 못하며 밤이 낮과 같이 비취나니 주에게는 흑암과 빛이 일반이니이다
13 Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.
주께서 내 장부를 지으시며 나의 모태에서 나를 조직하셨나이다
14 Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma.
내가 주께 감사하옴은 나를 지으심이 신묘막측하심이라 주의 행사가 기이함을 내 영혼이 잘 아나이다
15 Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.
내가 은밀한 데서 지음을 받고 땅의 깊은 곳에서 기이하게 지음을 받은 때에 나의 형체가 주의 앞에 숨기우지 못하였나이다
16 Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị.
내 형질이 이루기 전에 주의 눈이 보셨으며 나를 위하여 정한 날이 하나도 되기 전에 주의 책에 다 기록이 되었나이다
17 Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke! Leekwa ka ha si dị ukwuu.
하나님이여, 주의 생각이 내게 어찌 그리 보배로우신지요 그 수가 어찌 그리 많은지요
18 Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ, ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala. Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.
내가 세려고 할지라도 그 수가 모래보다 많도소이다 내가 깰 때에도 오히려 주와 함께 있나이다
19 O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi! Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara!
하나님이여, 주께서 정녕히 악인을 죽이시리이다 피흘리기를 즐기는 자들아 나를 떠날지어다
20 Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị; ndị iro gị na-ekwutọ aha gị.
저희가 주를 대하여 악하게 말하며 주의 원수들이 헛되이 주의 이름을 칭하나이다
21 O Onyenwe anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị, na-asọkwa ndị na-enupu isi megide gị oyi?
여호와여, 내가 주를 미워하는 자를 미워하지 아니하오며 주를 치러 일어나는 자를 한하지 아니하나이까
22 Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ? Ana m agụnye ha dịka ndị iro m.
내가 저희를 심히 미워하니 저희는 나의 원수니이다
23 O Chineke, nyochaa m, mara obi m. Nwaa m, matakwa echiche uche m niile.
하나님이여, 나를 살피사 내 마음을 아시며 나를 시험하사 내 뜻을 아옵소서
24 Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m, ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.
내게 무슨 악한 행위가 있나 보시고 나를 영원한 길로 인도하소서

< Abụ Ọma 139 >