< Abụ Ọma 139 >

1 Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma
Don mai bi da kaɗe-kaɗe. Ta Dawuda. Zabura ce. Ya Ubangiji, ka bincike ni ka kuwa san ni.
2 Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile.
Ka san sa’ad da na zauna da sa’ad da na tashi; ka san tunanina daga nesa.
3 Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile.
Ka san fitata da kuma kwanciyata; ka saba da dukan hanyoyina.
4 O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwu tupu m kwuo ya.
Kafin in yi magana da harshena ka santa gaba ɗaya, ya Ubangiji.
5 Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ, ị tụkwasịla m aka gị.
Ka kewaye ni, gaba da baya; ka sa hannunka a kaina.
6 Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m, ọ dịkwa elu apụghị m iru ya.
Irin wannan sanin game da ni ya fi ƙarfin magana, ya fi ƙarfi in gane.
7 Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị? Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m?
Ina zan tafi daga Ruhunka? Ina zan gudu in tafi daga gabanka?
8 Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ. Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ. (Sheol h7585)
In na haura zuwa sammai, kana a can; in na yi gado a zurfafa, kana a can. (Sheol h7585)
9 Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa nʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri,
In na tashi a fikafikan safiya, in na sauka a gefe mai nisa na teku,
10 ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m aka nri gị ga-ejidesi m ike.
can ma hannunka zai bishe ni, hannunka na dama zai riƙe ni gam.
11 Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m ìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu.”
In na ce, “Tabbatacce duhu zai ɓoye ni haske kuma zai zama dare kewaye da ni,”
12 Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ; abalị ga-enye ìhè dịka ehihie, nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.
duhu ma ba zai zama duhu gare ka ba; dare zai haskaka kamar rana, gama duhu ya yi kamar haske gare ka.
13 Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.
Gama ka halicci ciki-cikina; ka gina ni gaba ɗaya a cikin mahaifar mahaifiyata.
14 Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma.
Ina yabonka domin yadda ka yi ni abin tsoro ne da kuma abin mamaki; ayyukanka suna da banmamaki, na san da haka sosai.
15 Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.
Ƙasusuwana ba a ɓoye suke a gare ka ba sa’ad da aka yi ni asirce. Sa’ad da saƙa ni gaba ɗaya a zurfafan duniya.
16 Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị.
Idanunka sun ga jikina marar fasali; dukan kwanakin da aka tsara mini a rubuce suke a littafinka kafin ɗayansu yă kasance.
17 Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke! Leekwa ka ha si dị ukwuu.
Tunaninka suna da daraja gare ni, ya Allah! Yawansu ba su da iyaka!
18 Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ, ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala. Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.
A ce zan iya ƙirgansu, za su fi yashin teku yawa. Sa’ad da na farka, ina nan tare da kai har yanzu.
19 O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi! Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara!
Da kawai za ka kashe mugaye, ya Allah! Ku rabu da ni, ku masu kisankai!
20 Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị; ndị iro gị na-ekwutọ aha gị.
Suna magana game da kai da mugun nufi; maƙiyanka suna ɗaukan sunanka a banza.
21 O Onyenwe anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị, na-asọkwa ndị na-enupu isi megide gị oyi?
Ba ina ƙin masu ƙinka ba, ya Ubangiji, ina kuma ƙyamar waɗanda suke tayar maka ba?
22 Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ? Ana m agụnye ha dịka ndị iro m.
Ba ni da wani abu da nake musu sai kiyaye kawai; na ɗauke su abokan gābana.
23 O Chineke, nyochaa m, mara obi m. Nwaa m, matakwa echiche uche m niile.
Ka bincike ni, ya Allah ka kuma san zuciyata; ka gwada ni ka kuma san damuwata.
24 Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m, ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.
Duba ko akwai wani laifi a cikina, ka bishe ni a madawwamiyar hanya.

< Abụ Ọma 139 >