< Abụ Ọma 138 >
1 Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị; nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto.
Of David. I will thank you, O Lord, with all my heart: in the sight of the gods I will sing your praise,
2 Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị aga m etokwa aha gị nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị dị elu karịa ihe niile.
and prostrate before your holy temple, will praise your name for your constant love, for you have exulted your promise above all.
3 Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m; i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike.
When I called you, you answered; you gave me strength, you inspired me.
4 O Onyenwe anyị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị, mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu.
All the kings of the earth shall praise you, O Lord, when they shall have heard the words you have uttered;
5 Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị, nʼihi na ebube Onyenwe anyị dị ukwuu.
and they shall sing of the ways of the Lord, and tell of the Lord’s transcendent glory.
6 Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya, ma ọ naghị ekwe ka ndị nganga bịa ya nso.
For, high though the Lord is, he looks on the lowly, and strikes down the haughty from far away.
7 A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu, ị na-echebe ndụ m; ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị, ị na-eji aka nri gị zọpụta m.
Though my way be distressful, yet you preserve me: you lay your hand on my angry foes, and your right hand gives me victory.
8 Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m; ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ahapụkwala ọrụ aka gị niile.
The Lord will accomplish all that which concerns me. Your kindness, O Lord, endures forever. O do not abandon the work of your hands.