< Abụ Ọma 136 >

1 Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma.
O give thanks to the LORD! for he is kind; For his goodness endureth for ever!
2 Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu.
O give thanks to the God of gods; For his goodness endureth for ever!
3 Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.
O give thanks to the Lord of lords; For his goodness endureth for ever!
4 Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche,
To him that alone doeth great wonders; For his goodness endureth for ever!
5 Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile,
To him that made the heavens with wisdom; For his goodness endureth for ever!
6 Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri,
To him that spread out the earth upon the waters; For his goodness endureth for ever!
7 Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa,
To him that made the great lights; For his goodness endureth for ever!
8 Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie,
The sun to rule the day; For his goodness endureth for ever!
9 Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị,
The moon and stars to rule the night; For his goodness endureth for ever!
10 Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt,
To him that smote in Egypt their first-born; For his goodness endureth for ever!
11 O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta,
And brought Israel from the midst of them; For his goodness endureth for ever!
12 O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha;
With a strong hand and an outstretched arm; For his goodness endureth for ever!
13 Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ,
To him who divided the Red sea into parts; For his goodness endureth for ever!
14 Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya,
And made Israel to pass through the midst of it; For his goodness endureth for ever!
15 Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile;
And overthrew Pharaoh and his host in the Red sea; For his goodness endureth for ever!
16 Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara,
To him who led his people through the wilderness; For his goodness endureth for ever!
17 Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu,
To him who smote great kings; For his goodness endureth for ever!
18 O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu,
And slew mighty kings; For his goodness endureth for ever!
19 O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait,
Sihon, the king of the Amorites; For his goodness endureth for ever!
20 Na Ọg eze Bashan,
And Og, the king of Bashan; For his goodness endureth for ever!
21 Were ala ha nye dịka ihe nketa,
And gave their land for an inheritance; For his goodness endureth for ever!
22 O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha,
For an inheritance to Israel his servant; For his goodness endureth for ever!
23 Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike,
Who remembered us in our low estate; For his goodness endureth for ever!
24 Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị,
And redeemed us from our enemies; For his goodness endureth for ever!
25 Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri,
Who giveth food unto all; For his goodness endureth for ever!
26 Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele.
O give thanks to the God of heaven; For his goodness endureth for ever!

< Abụ Ọma 136 >