< Abụ Ọma 135 >
1 Toonu Onyenwe anyị. Toonu aha Onyenwe anyị, toonu ya, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile,
Praise ye the Lord. Praise the Name of the Lord: ye seruants of the Lord, praise him.
2 unu ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị, nʼime ogige ụlọ Chineke anyị.
Ye that stande in the House of the Lord, and in the courtes of the House of our God,
3 Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị dị mma; bụkuo aha ya abụ otuto, nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi.
Praise ye the Lord: for the Lord is good: sing praises vnto his Name: for it is a comely thing.
4 Nʼihi na Onyenwe anyị ahọpụtala Jekọb nye onwe ya, ọ họpụtala Izrel ka ọ bụrụ ihe oke ọnụahịa nke aka ya.
For the Lord hath chosen Iaakob to himselfe, and Israel for his chiefe treasure.
5 Amaara m na Onyenwe anyị dị ukwuu, na Onyenwe anyị dị ukwuu karịa chi niile.
For I know that the Lord is great, and that our Lord is aboue all gods.
6 Onyenwe anyị na-eme ihe ọbụla masịrị ya nʼeluigwe na elu ụwa na nʼoke osimiri na nʼime ogbu mmiri niile.
Whatsoeuer pleased the Lord, that did hee in heauen and in earth, in the sea, and in all the depths.
7 Ọ bụ ya na-eme ka igwe ojii na-apụta site nʼakụkụ niile nke ụwa. Ọ bụkwa ya na-ezite amụma nke na-eweta mmiri ozuzo. Ọ na-ewepụtakwa ifufe site nʼụlọ ifufe ya niile.
He bringeth vp the cloudes from the ends of the earth, and maketh the lightnings with ye raine: he draweth foorth the winde out of his treasures.
8 O tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ụmụ mmadụ buru ụzọ mụọ na ụmụ anụ ụlọ e buru ụzọ mụọ.
He smote the first borne of Egypt both of man and beast.
9 O zipụrụ ihe ịrịbama ya dị iche iche na ọrụ ebube ya niile nʼetiti unu, o Ijipt, megide Fero na ndị niile na-ejere ya ozi.
He hath sent tokens and wonders into the middes of thee, O Egypt, vpon Pharaoh, and vpon all his seruants.
10 O tigburu ọtụtụ mba dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, tigbukwaa ndị eze ha, ndị dị ike nʼagha.
He smote many nations, and slew mightie Kings:
11 Ụfọdụ nʼime ha bụ Saịhọn, eze ndị Amọrait, na Ọg eze Bashan, na ndị eze niile dị na Kenan.
As Sihon King of the Amorites, and Og King of Bashan, and all the kingdomes of Canaan:
12 O weere ala ndị obodo ahụ niile nye ndị ya, nye ya ụmụ Izrel dịka ihe nketa ha.
And gaue their lande for an inheritance, euen an inheritance vnto Israel his people.
13 O Onyenwe anyị, aha gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi a maara aha gị ruo ọgbọ niile.
Thy Name, O Lord, endureth for euer: O Lord, thy remembrance is from generation to generation.
14 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekpepụta ndị ya. Ọ ga-enwekwa ọmịiko nʼahụ ndị ohu ya.
For the Lord will iudge his people, and be pacified towardes his seruants.
15 Chi ndị mba ọzọ bụ arụsị e jiri aka kpụọ, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ.
The idoles of the heathen are siluer and golde, euen the worke of mens handes.
16 Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ.
They haue a mouth, and speake not: they haue eyes and see not.
17 Ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ọ dịkwaghị nkuume dị nʼime ọnụ ha.
They haue eares and heare not, neither is there any breath in their mouth.
18 Ndị na-eme ha ga-adị ka ha. Ọ bụkwa otu a ka ndị na-atụkwasị ha obi ga-adị.
They that make them, are like vnto them: so are all that trust in them.
19 Ndị Izrel, toonu Onyenwe anyị. Unu ndị ụlọ Erọn, toonu Onyenwe anyị.
Praise the Lord, ye house of Israel: praise the Lord, ye house of Aaron.
20 Unu ndị ụlọ Livayị, toonu Onyenwe anyị; unu ndị na-atụ egwu ya, toonu Onyenwe anyị.
Praise the Lord, ye house of Leui: ye that feare the Lord, praise the Lord.
21 Ka otuto dịrị Onyenwe anyị site na Zayọn, nye onye ahụ na-ebi na Jerusalem. Toonu Onyenwe anyị.
Praised bee the Lord out of Zion, which dwelleth in Ierusalem. Praise ye the Lord.