< Abụ Ọma 133 >
1 Abụ nrigo, nke Devid. Lee ka o si bụrụ ihe dị mma na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!
Waƙar haurawa. Ta Dawuda. Abu mai kyau ne, mai daɗi kuma sa’ad da’yan’uwa suna zaman lafiya!
2 Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ, e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn, ruokwa nʼolu uwe mwụda ya.
Yana kamar mai mai darajar da aka zuba a kai, yana gangarawa a gemu, yana gangarawa a gemun Haruna, har zuwa wuyan rigunansa.
3 Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn. Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya, ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Yana kamar raɓar Hermon da take zubowa a kan Dutsen Sihiyona. Gama a can Ubangiji ya tabbatar da albarkarsa, har ma rai na har abada.