< Abụ Ọma 131 >

1 Abụ nrigo, nke Devid. O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m, ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m; adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m.
ヱホバよわが心おごらずわが目たかぶらず われは大なることと我におよばぬ奇しき事とをつとめざりき
2 Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ; dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ, e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m.
われはわが霊魂をもださしめまた安からしめたり 乳をたちし嬰兒のその母にたよるごとく 我がたましひは乳をたちし嬰兒のごとくわれに恃れり
3 Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị ugbu a na mgbe niile ebighị ebi.
イスラエルよ今よりとこしへにヱホバにたよりて望をいだけ

< Abụ Ọma 131 >