< Abụ Ọma 130 >

1 Abụ nrigo. O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa.
Nyimbo yoyimba pokwera ku Yerusalemu. Ndikulirira kwa Inu Yehova ndili mʼdzenje lozama;
2 Onyenwe anyị, nụrụ olu m. Ka ntị gị na-aṅakwa ntị nʼolu arịrịọ m, maka amara.
Ambuye imvani mawu anga. Makutu anu akhale tcheru kumva kupempha chifundo kwanga.
3 O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile, Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo?
Inu Yehova, mukanamawerengera machimo, Inu Yehova, akanayima chilili ndani wopanda mlandu?
4 Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie dị; ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi.
Koma kwa Inu kuli chikhululukiro; nʼchifukwa chake mumaopedwa.
5 Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya, ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị.
Ndimayembekezera Yehova, moyo wanga umayembekezera, ndipo ndimakhulupirira mawu ake.
6 Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ, e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ.
Moyo wanga umayembekezera Ambuye, kupambana momwe alonda amayembekezera mmawa, inde, kupambana momwe alonda amayembekezera mmawa,
7 Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide, nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa.
Yembekeza Yehova, iwe Israeli, pakuti Yehova ali ndi chikondi chosasinthika ndipo alinso ndi chipulumutso chochuluka.
8 Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel site na mmehie ya niile.
Iye mwini adzawombola Israeli ku machimo ake onse.

< Abụ Ọma 130 >