< Abụ Ọma 13 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m Onyenwe anyị? Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị?
Fún adarí orin. Saamu ti Dafidi. Yóò ti pẹ́ tó, Olúwa? Ìwọ o ha gbàgbé mi títí láé? Yóò tí pẹ́ tó tí ìwọ yóò máa fi ojú rẹ pamọ́ fún mi?
2 Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m? Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m?
Yóò ti pẹ́ tó tí èmi ó máa bá èrò mi jà, àti ní ojoojúmọ́ ni èmi ń ní ìbànújẹ́ ní ọkàn mi? Yóò ti pẹ́ tó tí àwọn ọ̀tá mi yóò máa borí mi?
3 Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m. Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ;
Wò mí kí o sì dá mi lóhùn, Olúwa Ọlọ́run mi. Fi ìmọ́lẹ̀ fún ojú mi, kí èmi ó má sún oorun ikú.
4 mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,” mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ.
Ọ̀tá mi wí pé, “Èmi ti ṣẹ́gun rẹ̀,” àwọn ọ̀tá mi yóò yọ̀ tí mo bá ṣubú.
5 Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ; mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị.
Ṣùgbọ́n mo gbẹ́kẹ̀lé ìfẹ́ rẹ tí kì í kùnà; ọkàn mi ń yọ̀ nínú ìgbàlà rẹ.
6 Aga m abụku Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.
Èmi ó máa kọrin sí Olúwa, nítorí ó dára sí mi.

< Abụ Ọma 13 >