< Abụ Ọma 13 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m Onyenwe anyị? Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị?
大卫的诗,交与伶长。 耶和华啊,你忘记我要到几时呢?要到永远吗? 你掩面不顾我要到几时呢?
2 Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m? Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m?
我心里筹算,终日愁苦,要到几时呢? 我的仇敌升高压制我,要到几时呢?
3 Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m. Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ;
耶和华—我的 神啊,求你看顾我,应允我! 使我眼目光明,免得我沉睡至死;
4 mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,” mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ.
免得我的仇敌说:我胜了他; 免得我的敌人在我摇动的时候喜乐。
5 Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ; mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị.
但我倚靠你的慈爱; 我的心因你的救恩快乐。
6 Aga m abụku Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.
我要向耶和华歌唱, 因他用厚恩待我。

< Abụ Ọma 13 >