< Abụ Ọma 129 >

1 Abụ nrigo. Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge, ka Izrel kwuo.
canticum graduum saepe expugnaverunt me a iuventute mea dicat nunc Israhel
2 “Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge, ma ha enweghị ike merie m.
saepe expugnaverunt me a iuventute mea etenim non potuerunt mihi
3 Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi, mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo.
supra dorsum meum fabricabantur peccatores prolongaverunt iniquitatem suam
4 Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume; ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume.”
Dominus iustus concidet cervices peccatorum
5 Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị bụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere.
confundantur et convertantur retrorsum omnes qui oderunt Sion
6 Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ nke na-akpọnwụ tupu o pupụta;
fiant sicut faenum tectorum quod priusquam evellatur exaruit
7 nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ, maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya.
de quo non implevit manum suam qui metit et sinum suum qui manipulos colligit
8 Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha, “Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu. Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị.”
et non dixerunt qui praeteribant benedictio Domini super vos benediximus vobis in nomine Domini

< Abụ Ọma 129 >