< Abụ Ọma 128 >
1 Abụ nrigo. Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.
Svētku dziesma. Svētīgs ikviens, kas To Kungu bīstas un staigā viņa ceļos.
2 Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.
Tu mitināsies no savu roku darba; svētīgs tu esi, tev labi klājās.
3 Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị.
Tava sieva būs kā auglīgs vīna koks ap tavu namu, tavi bērni kā eļļas zari ap tavu galdu.
4 Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị.
Redzi, tā ir svētīts tas vīrs, kas To Kungu bīstas.
5 Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,
Tas Kungs lai tevi svētī no Ciānas, ka tu redzi Jeruzālemes labumu visas savas mūža dienas,
6 ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị. Ka udo dịrị Izrel.
Un redzi savu bērnu bērnus: Miers lai ir pār Israēli.