< Abụ Ọma 128 >
1 Abụ nrigo. Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.
Waƙar haurawa. Masu albarka ne dukan masu tsoron Ubangiji, waɗanda suke tafiya a hanyoyinsa.
2 Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.
Za ka ci amfanin aikinka; albarku da wadata za su zama naka.
3 Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị.
Matarka za tă zama kamar kuringar inabi mai’ya’ya a cikin gidanka;’ya’yanka maza za su zama kamar tohon zaitun kewaye da teburinka.
4 Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị.
Ta haka mai albarka yake wanda yake tsoron Ubangiji.
5 Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,
Bari Ubangiji ya albarkace ka daga Sihiyona dukan kwanakin ranka; bari ka ga wadatar Urushalima,
6 ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị. Ka udo dịrị Izrel.
bari kuma ka rayu ka ga’ya’ya’ya’yanka. Salama tă kasance tare da Isra’ila.