< Abụ Ọma 127 >

1 Abụ nrigo, nke Solomọn. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ, ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo, nʼefu ka ndị nche na-amụ anya.
Pieśń stopni dla Salomona. Jeźli Pan domu nie zbuduje, próżno pracują ci, którzy go budują; jeźli Pan nie będzie strzegł miasta, próżno czuje ten, który go strzeże.
2 Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ na-adọgbu onwe gị nʼọrụ ịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị, nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo.
Próżno macie rano wstawać, długo siadać, i jeść chleb boleści, ponieważ Pan umiłowanemu swemu sen daje.
3 Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị, ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.
Oto dziatki są dziedzictwem od Pana, a płód żywota nagrodą.
4 Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha, otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị.
Jako strzały w ręku mocarza, tak są dziatki, które się darzą.
5 Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya. Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro na-arụrịta ụka nʼama.
Błogosławiony mąż, który niemi napełnił sajdak swój; nie będą zawstydzani, gdy się w bramie rozpierać będą z nieprzyjaciołmi swymi.

< Abụ Ọma 127 >