< Abụ Ọma 126 >
1 Abụ nrigo. Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn, anyị dị ka ndị na-arọ nrọ.
Nyimbo yoyimba pokwera ku Yerusalemu. Yehova atabwezera akapolo ku Ziyoni, tinali ngati amene akulota.
2 Ọchị juru anyị ọnụ, abụ ọṅụ jukwara anyị ire. Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị, “Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.”
Pakamwa pathu panadzaza ndi kuseka; malilime athu ndi nyimbo zachimwemwe. Pamenepo kunanenedwa pakati pa anthu kuti, “Yehova wawachitira zinthu zazikulu.”
3 Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu, obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ.
Yehova watichitira zinthu zazikulu, ndipo tadzazidwa ndi chimwemwe.
4 Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị, dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev.
Tibwezereni madalitso athu, Inu Yehova, monga mitsinje ya ku Negevi.
5 Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ.
Iwo amene amafesa akulira, adzakolola akuyimba nyimbo zachimwemwe.
6 Onye ji ịkwa akwa buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga, ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ, mgbe ha bu ukwu ọka ha.
Iye amene amayendayenda nalira, atanyamula mbewu yokafesa, adzabwerera akuyimba nyimbo zachimwemwe, atanyamula mitolo yake.