< Abụ Ọma 125 >

1 Abụ nrigo. Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 2 Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu, otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi. 3 Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza, nʼihi na ndị ezi omume nwere ike itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ. 4 O Onyenwe anyị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma, ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi. 5 Ma Onyenwe anyị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọ na ndị niile na-eme ajọ ihe. Ka udo dịrị Izrel.

< Abụ Ọma 125 >