< Abụ Ọma 125 >
1 Abụ nrigo. Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
En visa i högre choren. De som hoppas uppå Herran, de skola icke falla, utan evinnerliga blifva, såsom det berget Zion.
2 Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu, otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.
Omkring Jerusalem äro berg; och Herren är omkring sitt folk, ifrå nu och i evighet.
3 Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza, nʼihi na ndị ezi omume nwere ike itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ.
Ty de ogudaktigas spira skall icke blifva öfver de rättfärdigas hop; på det de rättfärdige icke skola uträcka sina hand till orättfärdighet.
4 O Onyenwe anyị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma, ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi.
Herre, gör väl vid dem som gode och fromhjertade äro.
5 Ma Onyenwe anyị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọ na ndị niile na-eme ajọ ihe. Ka udo dịrị Izrel.
Men de som afvika uppå deras vrånga vägar, dem skall Herren bortdrifva med de ogerningsmän. Men frid vare öfver Israel.