< Abụ Ọma 123 >

1 Abụ nrigo. Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị, gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe.
canticum graduum ad te levavi oculos meos qui habitas in caelo
2 Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya, na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje, otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya, ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere.
ecce sicut oculi servorum in manibus dominorum suorum sicut oculi ancillae in manibus dominae eius ita oculi nostri ad Dominum Deum nostrum donec misereatur nostri
3 Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere, nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha.
miserere nostri Domine miserere nostri quia multum repleti sumus despectione
4 Nʼihi na nnagide anyị na-anagide ịchị ọchị ndị nganga, na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.
quia multum repleta est anima nostra obprobrium abundantibus et despectio superbis

< Abụ Ọma 123 >