< Abụ Ọma 122 >

1 Abụ nrigo, nke Devid. Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m, “Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.”
Orin fún ìgòkè. Ti Dafidi. Inú mi dùn nígbà tí wọ́n wí fún mi pé, “Ẹ jẹ́ kí á lọ sílé Olúwa.”
2 Ụkwụ anyị eguzola ugbu a nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem.
Ẹsẹ̀ wa yóò dúró ní ẹnu ibodè rẹ, ìwọ Jerusalẹmu.
3 E wuru Jerusalem dịka obodo a chịkọtara ọnụ nke ọma.
Jerusalẹmu, ìwọ tí a kọ́ bí ìlú tí o fi ara mọ́ra pọ̀ ṣọ̀kan.
4 Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo, bụ ebo niile nke Onyenwe anyị, ịbụku aha Onyenwe anyị abụ dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị.
Níbi tí àwọn ẹ̀yà máa ń gòkè lọ, àwọn ẹ̀yà Olúwa, ẹ̀rí fún Israẹli, láti máa dúpẹ́ fún orúkọ Olúwa.
5 Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị, bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid.
Nítorí ibẹ̀ ni a gbé ìtẹ́ ìdájọ́ kalẹ̀, àwọn ìtẹ́ ilé Dafidi.
6 Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem: “Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nọọ nʼudo.
Gbàdúrà fún àlàáfíà Jerusalẹmu; àwọn tí ó fẹ́ ọ yóò ṣe rere.
7 Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị niile nchekwa dịrịkwa nʼime ebe nche gị niile e wusiri ike.”
Kí àlàáfíà kí ó wà nínú odi rẹ̀, àti ìre nínú ààfin rẹ̀.
8 Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m, ana m ekwu okwu sị, “Udo dịrị gị.”
Nítorí àwọn ọkùnrin àti àwọn ẹgbẹ́ mi èmi yóò wí nísinsin yìí pé, kí àlàáfíà kí ó wà nínú rẹ̀.
9 Nʼihi ụlọ Onyenwe anyị, Chineke anyị, aga m achọ ọganihu gị.
Nítorí ilé Olúwa Ọlọ́run wa, èmi yóò máa wá ìre rẹ̀.

< Abụ Ọma 122 >