< Abụ Ọma 122 >
1 Abụ nrigo, nke Devid. Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m, “Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.”
En sang ved festreisene; av David. Jeg gleder mig ved dem som sier til mig: Vi vil gå til Herrens hus.
2 Ụkwụ anyị eguzola ugbu a nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem.
Våre føtter står i dine porter, Jerusalem!
3 E wuru Jerusalem dịka obodo a chịkọtara ọnụ nke ọma.
Jerusalem, du velbyggede, lik en by som er tett sammenføiet,
4 Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo, bụ ebo niile nke Onyenwe anyị, ịbụku aha Onyenwe anyị abụ dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị.
hvor stammene drar op, Herrens stammer, efter en lov for Israel, for å prise Herrens navn!
5 Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị, bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid.
For der er stoler satt til dom, stoler for Davids hus.
6 Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem: “Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nọọ nʼudo.
Bed om fred for Jerusalem! La det gå dem vel som elsker dig!
7 Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị niile nchekwa dịrịkwa nʼime ebe nche gị niile e wusiri ike.”
Der være fred innen din voll, ro i dine saler!
8 Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m, ana m ekwu okwu sị, “Udo dịrị gị.”
For mine brødres og mine venners skyld vil jeg si: Fred være i dig!
9 Nʼihi ụlọ Onyenwe anyị, Chineke anyị, aga m achọ ọganihu gị.
For Herrens, vår Guds huses skyld vil jeg søke ditt beste.