< Abụ Ọma 121 >

1 Abụ nrigo. Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile, olee ebe inyeaka ga-esi bịara m?
I will lift up my eyes to the mountains. From where shall my help come?
2 Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa bịa.
My help is from Jehovah, who made heaven and earth.
3 Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ, onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile;
He will not allow thy foot to be moved. He who keeps thee will not slumber.
4 nʼezie onye na-eche Izrel nche adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra.
Behold, he who keeps Israel will neither slumber nor sleep.
5 Onyenwe anyị na-eche gị nche, Onyenwe anyị bụ ndo gị nʼaka nri gị;
Jehovah is thy keeper. Jehovah is thy shade upon thy right hand.
6 anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie, ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị.
The sun shall not smite thee by day, nor the moon by night.
7 Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị. Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile.
Jehovah will keep thee from all evil. He will keep thy soul.
8 Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata, site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.
Jehovah will keep thy going out and thy coming in from this time forth and for evermore.

< Abụ Ọma 121 >