< Abụ Ọma 120 >

1 Abụ nrigo. Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m, ọ na-azakwa m.
Píseň stupňů. K Hospodinu v ssoužení svém volal jsem, a vyslyšel mne.
2 O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha na ire na-ekwu okwu aghụghọ.
Hospodine, vysvoboď duši mou od rtů lživých, a od jazyka lstivého.
3 Gịnị ka a ga-eme gị, ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị, gị ire aghụghọ?
Coť prospěje, aneb coť přidá jazyk lstivý,
4 Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ, ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere.
Podobný k střelám přeostrým silného, a k uhlí jalovcovému?
5 Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek, nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda!
Běda mně, že pohostinu býti musím v Mešech, a přebývati v saláších Cedarských.
6 Ogologo oge ka m binyere ndị kpọrọ udo asị.
Dlouho bydlí duše má mezi těmi, kteříž nenávidí pokoje.
7 Abụ m onye udo; ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.
Já ku pokoji, ale když mluvím, oni k boji.

< Abụ Ọma 120 >