< Abụ Ọma 12 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma nke Devid. Onyenwe anyị, nyere anyị aka! Nʼihi na ndị ezi omume agwụla! Ndị kwesiri ntụkwasị obi anọkwaghị nʼetiti ụmụ mmadụ.
For the music director. To the Sheminith. A psalm of David. Help, Lord, for all the good people have gone! Those who trust in you have disappeared from among the people on earth.
2 O nwekwaghị onye eziokwu dị nʼọnụ ya nye onye agbataobi ya. Egbugbere ọnụ onye ọbụla na-ekwukwa okwu ire ụtọ, maọbụ aghụghọ dị nʼobi ha.
Everyone lies to their neighbors. They flatter with nice talk, but they don't mean what they say.
3 Ka Onyenwe anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi.
Stop their flattery, Lord, and silence their boasts—
4 Ndị na-asị, “Ọ bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri; egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, ọ bụ onye na-achị anyị?”
these people who say, “We will succeed through what we say; our mouths belong to us. We don't take orders from anyone!”
5 “Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe nʼihi ndị nọ na mkpa na-asụ ude, aga m ebili ugbu a, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m zọpụta ha pụọ nʼaka ndị ahụ ji iwe ekwulu ha.”
“Because of the violence the helpless have suffered, and because of the groans of the poor, I will rise up to defend them,” says the Lord. “I will give them the protection they have been longing for.”
6 Okwu ọnụ Onyenwe anyị niile zuruoke, ha dịka ọlaọcha a nụchara nʼọkụ, nke a nụchara ugboro asaa.
What the Lord says is trustworthy, as pure as silver refined seven times in a furnace.
7 O Onyenwe anyị, i ga-edebe anyị nʼudo ma sitekwa nʼaka ndị dị otu a chebe anyị ruo mgbe ebighị ebi.
You, Lord will keep the oppressed safe; you will protect us from these kinds of people forever;
8 Ndị ajọ omume na-ejegharị nʼebe niile mgbe a na-eto ihe ọjọọ nʼetiti ụmụ mmadụ.
even though the wicked are all around us, and evil is being promoted everywhere.

< Abụ Ọma 12 >